NKPUGHE 21:9-11
NKPUGHE 21:9-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ahụ, nke ji efere asaa ahụ nke ihe ntaramahụhụ dị nʼime ya bịakwutere m sị m, “Soro m, ka m gosi gị nwaagbọghọ ahụ bụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” O buuru m nʼime Mmụọ buga m nʼotu ugwu buru ibu nke ịdị elu ya dịkwa ukwuu. O gosiri m obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ka o si na mbara eluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. O jupụtara nʼebube Chineke, na-enwu ma na-achakwa dịka nkume dịkarịsịrị oke ọnụahịa, dịka nkume jaspa, na-enwu dịka kristal.
NKPUGHE 21:9-11 Bible Nso (IGBOB)
Otù nime ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ọkwa asa ahu, ndi eboro ibu ihe-otiti asa ikpe-azu, we bia; o we kpayerem uka, si, Biari, M'gēgosi gi nwanyi ahu anālu ọhu, bú nwunye Nwa-aturu ahu. O we bupum nime Mọ Nsọ ga rue oké ugwu di elu, we gosim obodo nsọ ahu, bú Jerusalem, ka ọ nēsi n'elu-igwe ridata, site n'ebe Chineke nọ, nēnwe ebube Chineke: ìhè ọ nēnye yiri nkume dikarisiri oké ọnu-ahia, dika nkume jasper, dika crystal