NKPUGHE 12:14-16
NKPUGHE 12:14-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma e nyere nwanyị ahụ nku abụọ, nke dịka nku oke ugo, ka o jiri gbanarị agwọ ochie ahụ feba nʼime ọzara, ebe a kwadooro ya, na ebe a ga-anọ lezie ya anya afọ atọ na ọnwa isii. Ma agwọ ahụ meghere ọnụ ya mee ka mmiri si nʼọnụ ya sọpụta dịka iyi nke ga-ebufu nwanyị ahụ. Ma ala nyeere nwanyị ahụ aka. O meghere ọnụ ya loda idee mmiri a nke si nʼọnụ agwọ ahụ sọpụta.
Kesaa
Gụọ NKPUGHE 12NKPUGHE 12:14-16 Bible Nso (IGBOB)
Ewe nye nwanyi ahu nkù abua ahu nke oké ugo ahu, ka o we febà n'ọhia la n'ọnọdu-ya, ebe anāzù ya otù oge, na oge abua, na nkera otù oge, ka ọ pua n'iru agwọ ahu. Agwọ ahu we b͕uputa miri n'ọnu-ya n'azu nwanyi ahu dika osimiri, ka o we me ka osimiri ahu bupu ya. Ala we yere nwanyi ahu aka, ala we saghe ọnu-ya, loda osimiri ahu, nke dragon ahu b͕uputara n'ọnu-ya.
Kesaa
Gụọ NKPUGHE 12