ABÙ ỌMA 98:1-3
ABÙ ỌMA 98:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Bụkuonụ ONYENWE ANYị abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta. ONYENWE ANYị emeela ka a mata nzọpụta ya o kpugheela ezi omume ya nye mba niile. O chetala ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị; nsọtụ nke ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 98ABÙ ỌMA 98:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Bùkuenu Jehova abù ọhu; N'ihi na Ọ luwo oké ọlu di iche iche; Aka-nri-Ya na ogwe-aka-Ya di nsọ enyewo Ya nzọputa. Jehova emewo ka amara nzọputa-Ya: N'anya mba nile ka O kpugheworo ezi omume-Ya. O chetawo ebere-Ya na ikwesi-ntukwasi-obi-Ya n'ebe ulo Israel di: Nsọtu nile nke uwa ahuwo nzọputa Chineke-ayi.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 98