ABÙ ỌMA 95:1-7
ABÙ ỌMA 95:1-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo ONYENWE ANYị abụ; ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ. Ka anyị jiri ekele bịakwute ya jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma. Nʼihi na ONYENWE ANYị bụ Chineke dị ukwuu, eze ukwuu kachasị chi niile elu. Ebe niile michasịrị emi nke ụwa dị nʼaka ya, ebe kachasị elu nke ugwu niile bụkwa nke ya. Osimiri niile bụ nke ya, nʼihi na ọ bụ ya kere ha, aka ya kpụrụ ala akọrọ niile. Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe, ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu ONYENWE ANYị, onye kere anyị; nʼihi na ọ bụ Chineke anyị anyị bụkwa ndị ọ na-azụ dịka atụrụ, igwe atụrụ ọ na-elekọta anya.
ABÙ ỌMA 95:1-7 Bible Nso (IGBOB)
Bianu, ka ayi tikue Jehova nkpu ọṅù: Ka ayi tikusie oké nkume nke nzọputa-ayi nkpu ọṅù ike. Ka ayi were ekele bia n'iru Ya, Ka ayi were abù ọma tikusie Ya nkpu ọṅù ike. N'ihi na Chineke uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa Eze uku nāchi chi nile. Onye ebe nile nke michasiri emi nke uwa di n'aka-Ya: Ebe dichasi elu nke ugwu nile bu kwa nke Ya. Onye nwere oké osimiri, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya; Ọ bu kwa aka-Ya kpuru ala-akọro. Batanu, ka ayi kpọ isi ala ruru kwa ala; Ka ayi b͕ue ikperè n'ala n'iru Jehova Onye meworo ayi: N'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke-ayi: Ayi onwe-ayi bu kwa ndi Ọ nāzù dika aturu, buru kwa ìgwè aturu nke aka-Ya. Ta, ọ buru na unu ege nti olu-ya