Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 94:1-23

ABÙ ỌMA 94:1-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

O ONYENWE ANYị, Chineke onye na-abọ ọbọ, o Chineke, onye na-abọ ọbọ, zipụta onwe gị. Bilie, o Onye Ikpe nke ụwa; kwụghachi ndị nganga ụgwọ ọrụ ruuru ha. ONYENWE ANYị, ọ bụ ruo ole mgbe? Ọ bụ ruo ole mgbe ka ndị na-eme ajọ omume ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ? Ha na-ekwuwapụ okwu mpako; ndị niile na-eme ajọ ihe jupụtara nʼitu ọnụ. Ha na-azọpịa ndị gị, O ONYENWE ANYị; ha na-emegbu ihe nketa gị. Ha na-egbu ndị di ha nwụrụ na ndị ọbịa; ha na-egbu ndị na-enweghị nna. Ha na-asị, “ONYENWE ANYị anaghị ahụ ihe ndị a; Chineke Jekọb na-agba nkịtị.” Lezienụ anya, unu ndị amamihe kọrọ nʼetiti ndị m; unu ndị nzuzu, olee mgbe unu ga-amụta ihe? Ọ pụtara na onye kpụrụ ntị anaghị anụ ihe? Ọ pụtara na onye kere anya anaghị ahụ ụzọ? Ọ pụtara na onye na-adọ mba niile aka na ntị agaghị ata ha ahụhụ? Ọ pụtara na onye na-ezi mmadụ ihe enweghị ihe ọmụma? ONYENWE ANYị maara echiche obi mmadụ; ọ maara na ihe mmadụ na-eche nʼobi ya bụ naanị ihe na-enweghị isi. Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye ị na-adọ aka na ntị, O ONYENWE ANYị, onye ahụ ị na-akụziri ihe site nʼiwu gị; ị na-enye ya izuike site nʼụbọchị nsogbu; tutu ruo mgbe a ga-egwuru ndị ajọ omume olulu. Nʼihi na ONYENWE ANYị agaghị ajụ ndị ya; ọ gaghị agbakụta ihe nketa ya azụ. Ezi omume ga-abụ ntọala ikpe ikpe niile; ndị niile ndị ziri ezi nʼobi ga-agbasokwa ya. Onye ga-ebiliri m imegide ndị ajọ omume? Onye ga-eguzo nʼọnọdụ m imegide ndị na-eme ajọ ihe? A sị na ONYENWE ANYị abịaghị nyere m aka, agaara m rịị abụ onye nwụrụ anwụ. Mgbe m kwuru sị, “Ụkwụ m na-agbuchapụ,” ọ bụ ịhụnanya gị, O ONYENWE ANYị, kwagidere m. Mgbe oke nchekasị obi batara nʼime m, nkasiobi gị wetara mkpụrụobi m ọṅụ. A ga-ejikọta gị na ocheeze ọchịchị ya rụrụ arụ, nke na-eweta mmekpa ahụ site nʼiwu ya? Ndị ajọ omume na-ejikọta onwe ha imegide ndị ezi omume na-amakwa ndị aka ha dị ọcha ikpe ọnwụ. Ma ONYENWE ANYị a bụrụla ebe mgbaba e wusiri ike nye m, na Chineke m na oke nkume ebe m na-ezere ndụ. Ọ ga-akwụghachi ha ụgwọ ọrụ kwesiri mmehie ha, lakwaa ha nʼiyi nʼihi ajọ omume ha; ONYENWE ANYị Chineke anyị ga-ala ha nʼiyi.

ABÙ ỌMA 94:1-23 Bible Nso (IGBOB)

Chineke nke ọ́bọ̀ nile, Jehova, Chineke nke ọ́bọ̀ nile, nwuputa ìhè. Bulie Onwe-gi, Onye-ikpe nke uwa: Nyeghachi ndi-npako nmeso-ha. Jehova, rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu, Rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu gāṅuri ọṅu-agha? Ha nēkwuwa okwu-ọnu, ha nēkwu oké okwu: Ndi nile nke nālu ajọ ihe nānya isi. Ndi-Gi ka ha nāzọpia, Jehova, Ọ bu kwa ihe-nketa-Gi ka ha nēweda n'ala. Ha nēb͕u nwanyi di-ya nwuru, na ọbìa, Ha nēb͕u kwa umu-nb͕ei n'ọchu. Ha we si, Ja agaghi-ahu, Chineke nke Jekob agaghi-amata kwa. Ghọtanu, unu ndi bu anu-ọhia n'etiti ndi Israel: Unu ndi-nzuzu kwa, òle mb͕e unu gēnwe uche? Onye nāku nti dika ihe-ọkukú, Ọ̀ gaghi-anu íhe? Ma-ọbu Onye nākpu anya, Ọ̀ gaghi-ahuwa uzọ? Onye nādọ mba nile aka na nti, Ọ̀ gaghi-aba nba, Bú Onye nēzí madu ihe-ọmuma? Jehova mara èchìchè madu, Na èchìchè ahu bu nání otù nku-ume. Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke I nādọ aka na nti, Ja, Onye I nēsi kwa n'iwu-Gi zí ihe; Ime ka ọ nọ jū pua n'ubọchi nile nke ihe ọjọ, Rue mb͕e agēgwuru onye nēmebi iwu olùlù. N'ihi na Jehova agaghi-ara ndi-Ya aka, Ọ gaghi-arapu kwa ihe-nketa-Ya. N'ihi na ikpé gālaghachikute ezi omume: Ndi nile ndi ziri ezi n'obi gēso kwa ya. Ònye gēbilirim imegide ndi nēme ihe ọjọ? Ònye gēme onwe-ya ka o guzosierem ike imegide ndi nālu ajọ ihe? Ọ buru na Jehova abughi onye nēyerem aka, Ọ fọduru nwa mb͕e nkpuru-obim gēbiwori n'ebe inọ-dū. Ọ buru na asiwom, Ewezugawo ukwum n'ọnọdu-ya; Ebere-Gi nākwagidem, Jehova. Mb͕e ncheb͕um nāba uba n'imem, Nkasi-obi-Gi nile nāgugu nkpuru-obim. Àgējikọta Gi na oche-eze nke ihe-ila-n'iyì nile, Nke nēji ukpuru kpuzí nmeb͕u? Ha nēdo onwe-ha n'usu ndi nāpunara madu ihe imegide nkpuru-obi onye ezi omume, Ọ bu kwa ọbara nēmeghi ihe ọjọ ka ha nāma ikpe. Ma Jehova aburuworom ulo-elu; Chinekem bu kwa oké nkume nke ebe-nb͕abàm. O mewo kwa ka ajọ ihe-ha laghachikute ha, Ọ bu kwa ihe ọjọ ha ka Ọ gēji kpochapu ha; Jehova, bú Chineke-ayi, gēkpochapu ha.