ABÙ ỌMA 92:12-15
ABÙ ỌMA 92:12-15 Bible Nso (IGBOB)
Onye ezi omume gāwa igù dika nkwu: Dika osisi cedar nime Lebanon ka o gēbù ibù. Ndi akuworo n'ulo Jehova dika osisi Gāma akwukwọ n'ogige nile nke Chineke-ayi. Ha gānọ nāmi nkpuru n'isi-awọ; Osisi nke miri di ha n'aru ri nne, nke nwezu-kwa-ra akwukwọ ndu, ka ha gābu. Igosi na Jehova zirí ezi; Ọ bu oké nkumem, ọ dighi kwa ajọ omume di nime Ya.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 92ABÙ ỌMA 92:12-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ndị ezi omume ga-awa igu dịka osisi nkwụ; ha ga-ebukwa ibu dịka osisi ukwu sida nke Lebanọn, nke a kụrụ nʼime ụlọ ONYENWE ANYị, ha ga-eto, wasaakwa nʼime ogige Chineke anyị. Ha ga-amị mkpụrụ, ọ bụladị mgbe ha mere agadi. Ha ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ, na-ekwupụta, “ONYENWE ANYị bụ Onye ziri ezi; ọ bụ Oke Nkume m, ọ dịkwaghị ajọ omume dị nʼime ya.”
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 92