ABÙ ỌMA 90:1-17
ABÙ ỌMA 90:1-17 Bible Nso (IGBOB)
Onye-nwe-ayi, ebe-obibi ka Gi onwe-gi buworo ayi N'ọb͕ọ nile. Tutu amuputa ugwu, Ma-ọbu tutu I kpua uwa na elu-uwa dum madu bi, Ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi, Gi onwe-gi bu Chineke. I nēme ka madu laghachi n'ájá; I we si, Laghachinu, umu madu. N'ihi na nnù arọ abua na ọgu iri n'anya-Gi Di ka nnyahuru mb͕e ọ nāga, Na dika otù nche n'abali. I wuchapuwo ha dika oké miri-ozuzo; nání ura ka ha bu: N'ututu ha di ka ahihia nētó etó. N'ututu ọ nāb͕awa uzari, nētó kwa etó; N'anyasi ka anēbipu ya, o we kpọnwua. N'ihi na emewo ka ayi gwusia n'iwe-Gi, Ọ bu kwa n'ọnuma-Gi ka emeworo ka ayi ma jijiji. I dowo ajọ omume nile ayi n'iru Gi, I dowo nmehie-ayi zoro ezo n'ìhè nke iru-Gi. N'ihi na ubọchi-ayi nile agawo nime nrubiga-ókè nke iwe-Gi: Ayi emewo ka arọ nile ayi gwusia dika otù nze-ume. Ubọchi arọ nile ayi di ọgu arọ atọ na iri; Ma ọ buru na ha esite n'idi-ike-ayi rue ọgu arọ anọ, Otú ọ di, nganga-ha bu nání idọb͕u-onwe-ha-n'ọlu na ajọ ihe; N'ihi na ọ b͕apuwo ọsọsọ, ayi we fela dika nnunu. Ònye mara ike nke iwe-Gi, Na nrubiga-ókè nke iwe-Gi dika egwu nke kwesiri Gi si di? Si otú a me ka ayi mara iguta ubọchi-ayi, Ka ayi we me ka obi amam-ihe bia. Lata, Jehova; rùe ole mb͕e? Chèghari kwa obi-Gi bayere ndi-orù-Gi. Were ebere-Gi me ka afọ ju ayi n'ututu; Ka ayi we tie nkpu ọṅù, ṅuri kwa, ubọchi-ayi nile. Me ka ayi ṅuria dika ubọchi nile si di I wedaworo ayi n'ala nime ha, Na dika arọ si di nke ayi huworo ihe ọjọ nime ha. Kwe ka ndi-orù-Gi hu ọlu-Gi, Kwe kwa ka ahu ima-nma-Gi n'aru umu-ha. Ka idi-utọ nke Onye-nwe-ayi, bú Chineke-ayi, dikwasi ayi: Gi me kwa ka ọlu aka-ayi guzosie ike n'aru ayi; E, ọlu aka-ayi, me ka o guzosie ike.
ABÙ ỌMA 90:1-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O Onyenwe anyị, ebe obibi ka gị onwe gị bụrịị nye anyị nʼọgbọ niile. Tupu e kee ugwu niile, na tupu a kpụọ ụwa na elu ụwa, siterị na mgbe ebighị ebi ruo ebighị ebi, ị bụ Chineke. Ị na-eme ka mmadụ laghachi bụrụ aja mgbe i kwuru okwu sị, “Unu ụmụ mmadụ, laghachi bụrụ aja.” Puku afọ dị nʼanya gị dịka otu ụbọchị; ha dịka ụnyaahụ gafere agafe maọbụ ka otu awa nke anyasị. Nʼime ụra nke ọnwụ ka ị na-ekpochapụ mmadụ; ha dịka ahịhịa ọhụrụ nke na-epupụta nʼisi ụtụtụ, ọ bụ ezie na ọ na-agbawa ụzarị na-etokwa eto nʼụtụtụ, ma nʼanyasị, ọ na-akpọnwụ ma-achanwụkwaa. E meela ka anyị gwụsịa nʼihi oke iwe gị megide anyị; anyị na-amakwa jijiji nʼihi ọnụma gị. Ị gbasaala njehie anyị niile nʼihu gị. Ị na-ahụzukwa mmehie nzuzo anyị niile. Ogologo ụbọchị anyị niile na-agabiga nʼoke iwe gị; afọ ndụ anyị nke fọdụrụ ka anyị na-ebi dịka okwu e ji nwayọọ kwuo na mwute. Ogologo ụbọchị anyị niile nwere ike ruo afọ iri asaa, maọbụ afọ iri asatọ, ma ọ bụrụ na ike anyị adịgide, ma otu ọ dị, nke a ga-asị na ọ bụ ya kachasị mma na-ejupụta na nsogbu na ịsụ ude, nʼihi na ha na-agabiga ọsịịsọ, anyị onwe anyị na-efelakwa. Onye pụrụ ịghọta ịdị ike nke oke iwe gị? Nʼihi na oke iwe gị dị ukwuu dịka ịtụ egwu kwesiri gị si dị ukwuu. Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ, ka anyị si otu a nweta obi amamihe jupụtara. O ONYENWE ANYị, nwee ntụgharị obi! Tutu ruo ole mgbe ka ọ ga-adị? Meere ndị ohu gị ebere. Jiri ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide, mejupụta anyị nʼụtụtụ, ka anyị nwee ike ịbụ abụ ọṅụ ma nwekwaa obi ụtọ ogologo ụbọchị ndụ anyị niile. Mee ka anyị nwee obi ụtọ, nke ọnụọgụgụ ụbọchị ya ga-adịkwa ka ọnụọgụgụ ụbọchị niile ị tara anyị ahụhụ, ka ọnụọgụgụ afọ ya dịkwa ka ọnụọgụgụ afọ niile anyị hụrụla nsogbu. Kwere ka ndị ohu gị hụ ọrụ gị dị iche iche, ka ụmụ ha hụkwa ịma mma gị. Ka ihuọma Chineke, Onyenwe anyị dịkwasị anyị; mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike, e, mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike.