ABÙ ỌMA 9:16-18
ABÙ ỌMA 9:16-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ihe e ji mara ONYENWE ANYị bụ ikpe ya ziri ezi; ọrụ aka ndị na-emebi iwu na-ama ha dịka ọnya. Sela Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili; nke a bụkwa ọnọdụ mba niile na-echefu Chineke. Ma ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echefu ndị nọ na mkpa; olileanya ndị a na-akpagbu agaghị abụkwa nke efu.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 9ABÙ ỌMA 9:16-18 Bible Nso (IGBOB)
Jehova emewo ka amara Ya onwe-ya, ezi ikpe ka O kpeworo: N'ọlu nke ọbu-aka-ya abua ka amaworo onye nēmebi iwu dika n'ọnyà. Higgaion. Selah Ndi nēmebi iwu gālaghachi n'ala mọ, Bú mba nile ndi nēchezo Chineke. N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka agēchezọ ob͕eye, Olile-anya nke ndi di ume-ala n'obi agaghi-ala n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 9