ABÙ ỌMA 9:1-12
ABÙ ỌMA 9:1-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ONYENWE ANYị, aga m esite nʼala ala obi m too gị, aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile ị na-eme. Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị, aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu. Ndị iro m na-alaghachi azụ, ha na-asọ ngọngọ na-alakwa nʼiyi nʼihu gị. I kpeela ikpe m nʼụzọ ziri ezi, nʼocheeze gị ka ị nọdụrụ na-ekpe ikpe ziri ezi. I baarala mba niile mba ma laa ndị ajọ omume nʼiyi, hichapụkwa aha ha ruo mgbe ebighị ebi. Mbibi nke na-enweghị ọgwụgwụ adakwasịla ndị iro m, I hopukwala obodo ha niile. Ọ dịghị onye na-echetakwa ha ọzọ. ONYENWE ANYị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ kwadoola ocheeze ya maka ikpe ikpe ziri ezi. Ọ ga-eji ezi omume kpee mba niile ikpe; jirikwa ikpe ziri ezi chịa mba niile. ONYENWE ANYị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu. Ọ bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu. ONYENWE ANYị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi, nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ. Bụkuonụ ONYENWE ANYị abụ otuto, bụ onye nọ nʼocheeze ya na Zayọn. Kwusaaranụ mba niile ihe banyere ọrụ ebube ya. Nʼihi na onye ahụ na-abọrọ ndị e gburu egbu ọbọ anaghị echefu ihe; ọ dịghị elefu mkpu akwa nke ndị a na-akpagbu anya.
ABÙ ỌMA 9:1-12 Bible Nso (IGBOB)
M'gēji obim nile kele Jehova; M'gākọ kwa akukọ oké ọlu-Gi nile. M'gāṅuri ọṅu, obim gātọkwam utọ, nime Gi: M'gābùku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu; Mb͕e ndi-irom laghachiri azu, Su ngọngọ, si kwa n'iru Gi la n'iyì. N'ihi na I kpewo ikpem ziri ezi na okwu-ikpem; I nọduru n'oche-eze, buru onye-ikpe nēme ezi omume. I basiwo mba nile ọzọ nba, I mewo ka ndi nēmebi iwu la n'iyì, I hichapuwo aha-ha rue mb͕e nile ebighi-ebi. Ndi-iro agwusiwo, ha bu nkpọnkpọ ebe rue mb͕e ebighi-ebi; Ọzọ, obodo nile nke I ropuworo, Ncheta-ha, ọbuná nke obodo ahu, alawo n'yì. Ma Jehova nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi: O doziwo oche-eze-Ya ikpe ikpe. Ya onwe-ya gēkpe uwa dum madu bi ikpe n'ezi omume, Ọ gēkpe ndi nile di n'uwa ikpe n'izi-ezi. Jehova bu-kwa-ra onye anāzọpia ulo-elu, Bú ulo-elu nke diri mb͕e nile nke nkpà; Ọzọ, ndi mara aha-Gi gātukwasi Gi obi; N'ihi na I rapughi ndi nāchọ Gi, Jehova. Bùkuenu Jehova abù ọma, bú Onye bi na Zaion: Gosinu omume-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche. N'ihi na Onye nājuta ọbara ndi eb͕uru eb͕u echetawo ha: O chezọghi iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala.