ABÙ ỌMA 87:1-7
ABÙ ỌMA 87:1-7 Bible Nso (IGBOB)
Ntọ-ala-Ya di n'ugwu nsọ nile. Jehova nāhu ọnu-uzọ-ama nile nke Zaion Kari ebe-obibi nile nke Jekob. Ihe di iche iche nke di nsọpuru ka anēkwu bayere gi, Obodo Chineke. Selah M'gēhota Rehab na Babilon, na ha di n'etiti ndi maram: Le Filistia na Taia, ha na Etiopia; Nka ka amuru n'ebe ahu. Ọ bu kwa Zaion ka agēkwu okwu bayere ya, si, Onye na onye ọ bula ka amuru nime ya; Ọzọ, Ya onwe-ya, bú Onye kachasi ihe nile elu, gēme ka o guzosie ike. Jehova gāgu, mb͕e O ji de ndi nile di iche iche n'akwukwọ, si, Nka ka amuru n'ebe ahu. Selah Ma ndi nābù abù ma ndi nēte egwú, ha nile gāsi, Isi-iyim nile di na Gi.
ABÙ ỌMA 87:1-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Chineke atọọla ntọala ya nʼelu ugwu nsọ ahụ; ONYENWE ANYị hụrụ ọnụ ụzọ ama Zayọn nʼanya, karịa ebe obibi niile nke Jekọb. Ihe dị iche iche nke dị ebube ka a na-ekwu banyere gị, O obodo Chineke; Sela “Aga m agụnye Rehab na Babilọn, dịka ndị na-asọpụrụ m, aga m agụnyekwa ndị Filistia, na ndị Taịa, na ndị Kush, aga m asị, ‘A mụrụ nke a na Zayọn.’ ” Nʼezie, a ga-ekwu okwu banyere Zayọn sị, “A mụrụ nke a na nke ọzọ nʼime ya, ya onwe ya, bụ Onye kachasị ihe niile elu, ga-eme ka o guzosie ike.” ONYENWE ANYị ga-ede nʼime akwụkwọ usoro nke ndị mmadụ: “A mụrụ onye a na Zayọn.” Dịka ha na-eti egwu, ha ga-abụ abụ sị, “Isi iyi m niile dị na gị.”