ABÙ ỌMA 86:14-16
ABÙ ỌMA 86:14-16 Bible Nso (IGBOB)
Chineke, ndi-nganga ebiliwo imegidem, Nzukọ ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim, Ha edoghi kwa Gi n'iru ha. Ma Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, bu Chineke Nke nwere obi-ebere, Onye di kwa amara, Nke nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n'ebere na ezi-okwu. Chem iru, me-kwa-ram amara Nye orù-Gi ike-Gi, Zọputa kwa nwa-nwoke nke orù-Gi nwayi.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 86ABÙ ỌMA 86:14-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O Chineke, ndị mpako na-emegide m; otù ndị mmadụ na-eme ihe ike na-achọ igbu m, ha bụ ndị na-ejighị gị kpọrọ ihe ọbụla. Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara, iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. Chee m ihu, mekwaara m amara. Nye ohu gị ike gị, zọpụtakwa nwa ohu gị nwanyị nʼihi na m na-ejere gị ozi.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 86