ABÙ ỌMA 86:11-17
ABÙ ỌMA 86:11-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Kuziere m ụzọ gị, O ONYENWE ANYị, ka m dabere nʼikwesị ntụkwasị obi gị; nye m obi na-adịghị agba abụọ, ka m nwee ike tụọ egwu aha gị. Aga m eji obi m niile too gị, O Onyenwe anyị, na Chineke m; aga m ebulikwa aha gị elu ruo mgbe niile ebighị ebi. Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu; i sitela nʼomimi nke dị ala site nʼala ndị nwụrụ anwụ dọpụta m. O Chineke, ndị mpako na-emegide m; otù ndị mmadụ na-eme ihe ike na-achọ igbu m, ha bụ ndị na-ejighị gị kpọrọ ihe ọbụla. Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara, iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. Chee m ihu, mekwaara m amara. Nye ohu gị ike gị, zọpụtakwa nwa ohu gị nwanyị nʼihi na m na-ejere gị ozi. Gosi m ihe ịrịbama nke ga-egosipụta ịdị mma gị, ka ndị iro m hụ ya si otu a bụrụ ndị ihere ga-eme, nʼihi na gị, O ONYENWE ANYị, nyere m aka ma kasịekwa m obi.
ABÙ ỌMA 86:11-17 Bible Nso (IGBOB)
Zim uzọ-Gi Jehova; m'gējeghari n'ezi-okwu-Gi: Me ka obim di n'otù itu egwu aha-Gi. M'gēji obim nile kele Gi, Onye-nwe-ayi, Chineke; M'gāsọpuru kwa aha-Gi rue mb͕e ebighi-ebi. N'ihi na ebere-Gi di uku n'arum; I siwo n'ala-mọ nke dichasi ala naputa nkpuru-obim. Chineke, ndi-nganga ebiliwo imegidem, Nzukọ ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim, Ha edoghi kwa Gi n'iru ha. Ma Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, bu Chineke Nke nwere obi-ebere, Onye di kwa amara, Nke nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n'ebere na ezi-okwu. Chem iru, me-kwa-ram amara Nye orù-Gi ike-Gi, Zọputa kwa nwa-nwoke nke orù-Gi nwayi. Merem ihe-iriba-ama bayere ezi ihe I gēmerem; Ka ndi nākpọm asì we hu ya, ka ihere we me ha, N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, eyeworom aka, kasikwam obi.