ABÙ ỌMA 86:11-12
ABÙ ỌMA 86:11-12 Bible Nso (IGBOB)
Zim uzọ-Gi Jehova; m'gējeghari n'ezi-okwu-Gi: Me ka obim di n'otù itu egwu aha-Gi. M'gēji obim nile kele Gi, Onye-nwe-ayi, Chineke; M'gāsọpuru kwa aha-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 86ABÙ ỌMA 86:11-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Kuziere m ụzọ gị, O ONYENWE ANYị, ka m dabere nʼikwesị ntụkwasị obi gị; nye m obi na-adịghị agba abụọ, ka m nwee ike tụọ egwu aha gị. Aga m eji obi m niile too gị, O Onyenwe anyị, na Chineke m; aga m ebulikwa aha gị elu ruo mgbe niile ebighị ebi.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 86