ABÙ ỌMA 84:1-4
ABÙ ỌMA 84:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Le ka ebe-obibi-Gi nile si buru eba ahuru n'anya nke-uku, Jehova nke usu nile nke ndi-agha! Agu agusiwo nkpuru-obim ike, e, ọ gwusiwo kwa n'ichọ ogige nile nke Jehova; Obim na anu-arum nētiku Chineke di ndu nkpu ọṅù. Ọbuná nnunu di ntà achọtawo ulo, Eléké achọtawo-kwa-ra onwe-ya akwu, ebe o tiyeworo umu-ya Bú ebe-ichu-àjà-Gi nile, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Ezem na Chinekem. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi bi n'ulo-Gi bu: Ha gānọ nēto Gi. Selah
ABÙ ỌMA 84:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Lee ka ebe obibi gị sị maa mma, O ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile! Ọ na-agụsị mkpụrụobi m agụụ ike, e mkpụrụobi m na-adakwa mba, ịbata nʼogige ONYENWE ANYị; mkpụrụobi m na anụ ahụ m na-eti mkpu na-achọ Chineke dị ndụ. Ọ bụladị ụmụ nnụnụ nta nke eluigwe, achọtala ebe obibi; eleke achọtakwarala onwe ya akwụ, ebe ọ ga na-edebe ụmụ ya, nʼakụkụ ebe ịchụ aja nsọ gị, O ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, Eze m na Chineke m. Ndị a gọziri agọzi ka ndị bi nʼụlọ gị bụ; ha na-eto gị mgbe niile. Sela