ABÙ ỌMA 74:10-14
ABÙ ỌMA 74:10-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O Chineke, ruo ole mgbe ka ndị iro ga-anọgide na-achị gị ọchị? Onye iro, ọ ga-eleli aha gị ruo mgbe ebighị ebi? Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị? Sepụta aka gị laa ha nʼiyi! Ma gị, O Chineke, bụrịị eze m site na mgbe ochie. Ọ bụ gị na-arụpụta nzọpụta nʼelu ụwa. Site nʼike gị dị ukwuu i mere ka osimiri kewaa abụọ. Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ nʼime mmiri. Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ a na-akpọ leviatan, mee ka ọ ghọọ nri nye ụmụ anụmanụ bi nʼọzara.
ABÙ ỌMA 74:10-14 Bible Nso (IGBOB)
Chineke, rùe ole mb͕e ka onye-nkpab͕u gāta uta? Onye-iro, ò gēlelì aha-Gi anya rue mb͕e ebighi-ebi? N'ìhi gini ka I nēseghachi aka-Gi, bú aka-nri-Gi? Seputa ya n'obi-Gi me ka ha gwusia. Ma Chineke bu Ezem site na mb͕e ochie, Nke nālu ọlu nzọputa n'etiti uwa Gi onwe-gi were ike-Gi tiwa oké osimiri: I tipiara isi nile nke ogologo anu-miri n'elu miri. Gi onwe-gi tipiasiri isi nile nke oké agu-iyi, I nēnye ya enye iburu otù ndi ihe-oriri, bú ndi bi n'ala kpọrọ nku.