ABÙ ỌMA 74:1-23
ABÙ ỌMA 74:1-23 Bible Nso (IGBOB)
Chineke, n'ìhi gini ka I juworo ayi aju rue mb͕e ebighi-ebi? N'ìhi gini ka iwe Gi nākwu anwuru imegide ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-Gi? Cheta nzukọ-Gi, nke I nwetaworo na mb͕e ochie, Nke I b͕aputaworo ibu ebo nke ihe-nketa-Gi; Cheta ugwu Zaion, ebe I biworo. Zọlie ije ngwa ngwa ibiaru ebe nile etikpọrọ ebighi-ebi; Onye-iro emewo ihe ọjọ nile n'ebe nsọ. Ndi nākpab͕u Gi ab͕ọwo uja n'etiti ebe-nzute-Gi; Ha edowo ihe-iriba-ama nile ha ibu ihe-iriba-ama, Amara ha dika onye nēbuli anyu-ike elu nke-uku N'alùghi-ulù nke osisi. Ma ub͕u a ihe-ya nile nke eb͕uru eb͕ub͕u, Ha nēwere anyu-ike ntà na otùtù di iche iche tipia ya n'otù. Ha esuwo ebe nsọ Gi ọku; Ọbuná rue ala ka ha meworo ebe-obibi aha-Gi ka ọ ghara idi nsọ. Ha siri n'obi-ha, Ka ayi me ha ihe-ike n'otù: Ha esurewo ebe-nzute nile nke Chineke n'ala. Ayi ahughi ihe-iriba-ama nile ayi: Ọ dighi onye-amuma di ọzọ; Ọ dighi kwa onye nọ n'etiti ayi nke mara mb͕e mb͕e gēru. Chineke, rùe ole mb͕e ka onye-nkpab͕u gāta uta? Onye-iro, ò gēlelì aha-Gi anya rue mb͕e ebighi-ebi? N'ìhi gini ka I nēseghachi aka-Gi, bú aka-nri-Gi? Seputa ya n'obi-Gi me ka ha gwusia. Ma Chineke bu Ezem site na mb͕e ochie, Nke nālu ọlu nzọputa n'etiti uwa Gi onwe-gi were ike-Gi tiwa oké osimiri: I tipiara isi nile nke ogologo anu-miri n'elu miri. Gi onwe-gi tipiasiri isi nile nke oké agu-iyi, I nēnye ya enye iburu otù ndi ihe-oriri, bú ndi bi n'ala kpọrọ nku. Gi onwe-gi kewara isi-iyi na miri-iyi: Gi onwe-gi mere ka osimiri nile nke nērù erù mb͕e nile takọrọ. Gi nwe ehihie, ọzọ kwa, Gi nwe abali: Gi onwe-gi edoziwo ihe nēnye ìhè na anyanwu. Gi onwe-gi emewo ka ókè-ala nile nke uwa guzo ọtọ: Mb͕e okpom-ọku na mb͕e oyi, Gi onwe-gi akpuwo ha. Cheta nka, na onye-iro atawo Jehova uta, Cheta kwa na otù ndi di nsọkwu eleliwo aha-Gi. Enyela anu-ọhia nkpuru-obi nke ndi gi: Echezọla ndu nke ndi-Gi ewedara n'ala rue mb͕e ebighi-ebi. Legide ọb͕ub͕a-ndu-Gi: N'ihi na ebe nile nke b͕ara ọchichiri nke uwa juputara n'ebe-obibi nile nke ihe-ike. Ekwela ka onye anāzọpia azọpia lata n'ihere: Me ka onye ewedara n'ala na ob͕eye to aha-Gi. Bilie, Chineke, kpe ọnu-Gi n'ikpe: Cheta uta anāta Gi site n'ọnu onye-nsọkwu ogologo ubọchi nile. Echezọla olu ndi nākpab͕u Gi: Nkpọtu nke ndi nēbili imegide Gi nāla elu mb͕e nile.
ABÙ ỌMA 74:1-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Chineke, gịnị mere i ji jụ anyị ruo mgbe ebighị ebi? Gịnị mere iwe gị ji akwụ anwụrụ megide igwe atụrụ ndị ị na-azụ? Cheta mba ahụ nke ị zụtara na mgbe ochie, ebo ahụ bụ ihe nketa gị, ndị ị gbapụtara, nʼugwu Zayọn ebe i biri. Tụgharịa nzọ ụkwụ gị bịa na mbibi ebighị ebi ndị a. Ọ bụ onye iro wetara ịla nʼiyi a niile nʼụlọnsọ a. Ndị iro gị gbọrọ ụja nʼebe i zutere anyị. Ha weliri ọkọlọtọ ha dịka ihe ịrịbama. Ha kpara agwa dịka ndị ikom ji anyụike ha ga-eji gbutuo ọtụtụ osisi dị nʼoke ọhịa. Ha ji anyụike na egbugbu ha kụjisie ihe niile eji amachi ihe bụ nke egbunyere ihe. Ha kpọkwara ụlọnsọ gị ọkụ, mee ya ka o repịa. Ha merụrụ ụlọ obibi ahụ a kpọkwasịrị aha gị. Ha sịrị nʼobi ha, “Anyị ga-etipịa ha kpamkpam!” Ha kpọrọ ebe niile a na-anọ efe Chineke nʼala a ọkụ. Enyeghị anyị ihe ịrịbama ọbụla site nʼaka Chineke. Ọ dịkwaghị ndị amụma fọdụrụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti anyị onye maara, mgbe ihe a ga-agwụ. O Chineke, ruo ole mgbe ka ndị iro ga-anọgide na-achị gị ọchị? Onye iro, ọ ga-eleli aha gị ruo mgbe ebighị ebi? Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị? Sepụta aka gị laa ha nʼiyi! Ma gị, O Chineke, bụrịị eze m site na mgbe ochie. Ọ bụ gị na-arụpụta nzọpụta nʼelu ụwa. Site nʼike gị dị ukwuu i mere ka osimiri kewaa abụọ. Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ nʼime mmiri. Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ a na-akpọ leviatan, mee ka ọ ghọọ nri nye ụmụ anụmanụ bi nʼọzara. Ọ bụ gị mere ka isi iyi na mmiri iyi na-asọ. I mere ka osimiri na-eru eru mgbe niile taa. Ehihie na abalị bụ nke gị. I mere ka anyanwụ na ọnwa guzosie ike. Ọ bụ gị kewapụtara oke ala niile nke ụwa. Ọ bụ gị mere ka ọkọchị na udu mmiri dị. O ONYENWE ANYị, cheta otu onye iro si chịa gị ọchị, na otu ndị nzuzu si kwaa aha gị emo. Ewerala ndụ nduru gị nyefee anụ ọhịa ọjọọ nʼaka. Echefukwala ndụ ndị gị a na-akpagbu ruo mgbe ebighị ebi. Chetakwa ọgbụgba ndụ gị, nʼihi na ihe ike na-ejupụta ebe niile gbara ọchịchịrị nʼala a. Ekwela ka ndị a na-akpagbu gbaghachi azụ nʼihere; ka ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa too aha gị. O Chineke, bilie, kpechitara onwe gị ikpe. Chetakwa otu ndị nzuzu si kọọ gị ọnụ ogologo ụbọchị niile. Elepụla mkpọtụ nke ndị iro gị niile anya, olu mkpọtụ nke ndị iro gị na-aga nʼihu na-ala elu.