ABÙ ỌMA 73:25-28
ABÙ ỌMA 73:25-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị? Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị. Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba, ma Chineke bụ ike nke obi m, na ihe nketa m ruo ebighị ebi. Ndị niile nọpụrụ gị nʼebe dị anya ga-ala nʼiyi. Ị ga-alakwa ndị niile na-ekwesighị ntụkwasị obi, nye gị nʼiyi. Ma nye mụ onwe m, ọ dị mma ịnọ Chineke nso. Emeela m Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị ebe mgbaba m. Aga m akọ banyere ọrụ gị niile dị iche iche.
ABÙ ỌMA 73:25-28 Bible Nso (IGBOB)
Ọ̀nye k m'nwere n'elu-igwe ma-ọbughi Gi? Ma-ọbughi Gi ọ dighi onye ihe-ya tọworom utọ n'uwa. Anu-arum na obim agwusiwo: Oké nkume nke obim na òkèm ka Chineke bu rue mb͕e ebighi-ebi. N'ihi na, le, ndi nọ gi n'ebe di anya gāla n'iyì: I kpochapuwo onye ọ bula nke nāpu n'aka-Gi akwa iko. Ma mu onwem, ibiaru Chineke nso dim nma: Edowom ebe-nb͕abàm n'Onye-nwe-ayi, bú Jehova, Ka m'we kọ akukọ bayere ije-ozi-Gi nile.