ABÙ ỌMA 73:23-26
ABÙ ỌMA 73:23-26 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ana m anọnyere gị mgbe niile; ị na-ejide m nʼaka nri m. Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m, ma emesịa, ị ga-anabata m nʼebube gị. Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị? Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị. Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba, ma Chineke bụ ike nke obi m, na ihe nketa m ruo ebighị ebi.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 73ABÙ ỌMA 73:23-26 Bible Nso (IGBOB)
Ma mu onwem nọ n'aka-Gi mb͕e nile: I jidewo aka-nrim. I gēji ndum-ọdu-Gi nēdum, Emesia I gēji kwa nsọpuru naram. Ọ̀nye k m'nwere n'elu-igwe ma-ọbughi Gi? Ma-ọbughi Gi ọ dighi onye ihe-ya tọworom utọ n'uwa. Anu-arum na obim agwusiwo: Oké nkume nke obim na òkèm ka Chineke bu rue mb͕e ebighi-ebi.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 73