ABÙ ỌMA 7:1-9
ABÙ ỌMA 7:1-9 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, bú Chinekem, na Gi ka m'b͕abàworo: Zọputam n'aka ndi nile nēsob͕um, naputakwam n'aka-ha: Ka ọ ghara idọka nkpuru-obim dika ọdum, Nētipia ya, mb͕e onye-nnaputa adighi. Jehova, bú Chinekem, ọ buru na emewom nka; Ọ buru na ajọ omume di n'ọbu-akam abua; Ọ buru na enyeghachiwom onye mu na ya di n'udo ihe ọjọ; (Kama nke ahu, adọputawom onye nākpab͕um n'efu:) Ka onye-iro chua mkpuru-obim, rue ya aru; Ka ọ zọda kwa ndum n'ala, Me ka nsọpurum biri n'ájá. Selah Bilie, Jehova, n'iwe-Gi, Welie Onwe-gi elu imegide nrubiga-ókè-iwe nke ndi nākpab͕um: Teta-kwa-ram; I nyewo ikpé iwu. Ka nzukọ nke ndi nile di n'uwa di kwa Gi buruburu: Gi laghachi kwa n'ebe di elu n'elu ya. Jehova nēkpe ndi nile di iche iche ikpe: Kpem ikpe, Jehova, dika ezi omumem si di, na dika izu-okèm si di nke di nimem. Biko, kwe ka ihe ọjọ nke ndi nēmebi iwu gwusia, ma me ka onye ezi omume guzosie ike: N'ihi na onye nānwa obi nile na akuru nile ka Chineke, bú Onye ezi omume, bu.
ABÙ ỌMA 7:1-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị Chineke m, nʼime gị ka m gbabara; zọpụta m, ma napụta m site nʼaka ndị niile na-achụ m ọsọ, ma ọ bụ ha adọkaa m dịka ọdụm, ha ga-adọsasịkwa m ebe mmadụ ọbụla enweghị ike ịnapụta m. O ONYENWE ANYị Chineke m, ọ bụrụ na m mere ihe dị otu a; ọ bụrụkwa na aka m adịghị ọcha. Ọ bụrụ na m jiri ihe ọjọọ kwụghachi onye mụ na ya nọ nʼudo ụgwọ, maọbụ site nʼụzọ na-ezighị ezi zuo ihe onye iro m. Mgbe ahụ, ka onye iro m chụọ m ọsọ, jide m; ka ọ tụọ m nʼala zọpịa ndụ m, mee ka m bụrụ onye a ga-ahapụ nʼuzuzu nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma. Sela Bilie, ONYENWE ANYị, nʼiwe gị, bilie megide oke iwe ndị iro m; teta Chineke m, kpee ikpe ziri ezi. Ka nzukọ niile chịkọtara onwe ha ọnụ gbaa gị gburugburu, ebe ị na-anọkwasịkwa nʼebe dị elu na-achị ha. Ka ONYENWE ANYị kpee ụmụ mmadụ niile ikpe. Kpee m ikpe, O ONYENWE ANYị, dịka ezi omume m si dị, na dịka izuoke m si dị, gị Onye kachasị ihe niile elu. O Chineke onye ezi omume, onye na-enyochapụta echiche na obi mmadụ, mee ka ihe ike ndị ajọ omume bịa na njedebe meekwa ka ndị ezi omume guzosie ike.