Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 69:19-36

ABÙ ỌMA 69:19-36 Bible Nso (IGBOB)

Gi onwe-gi amawo ita-utam, na iherem, na ọnọdu-iherem: N'iru Gi ka ndi-nkpab͕um nile nọ. Ita-uta etiwawo nkpuru-obim; anamariasi kwa ọria ike: M'we le anya onye gēgosim ebere o ji n'arum, ma ọ dighi onye ọ bula; M'le-kwa-ra anya ndi-nkasi-obi, ma achọtaghm onye ọ bula. Ha we nyem ńsí di ilu ka ọ buru ihe-oririm; Ọzọ mb͕e akpiri kpọrọm nku ha nēme ka m'ṅua manya-vine b͕ara uka. Me table-ha nke di n'iru ha ka ọ ghọ ib͕udu; Mb͕e ha nọ n'udo, ya ghọ kwa ọnyà. Me ka anya-ha b͕a ọchichiri, ka ha we ghara ihu uzọ; Me kwa ka úkwù-ha nāma jijiji mb͕e nile. Wukwasi ha iwe-Gi, Me kwa ka idi-ọku nke iwe-Gi rue ha aru. Me ka ebe-ulo-ikwū-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; Ekwela onye ọ bula bi n'ulo-ikwū nile ha. N'ihi na ọ bu onye Gi onwe-gi tib͕uworo ka ha sob͕uworo; Ọ bu kwa akukọ bayere ihe-nb͕u nke ndi I dupuworo ka ha nākọ. Tukwasi ajọ omume n'ajọ omume-ha: Ekwe-kwa-la ka ha ba n'ezi omume-Gi. Me ka ehichapu ha n'akwukwọ ndi di ndu, Ekwe-kwa-la ka edekọ ha na ndi ezi omume n'akwukwọ. Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na onye ihe nēb͕u nb͕u: Chineke, nzọputa-Gi gētiyem n'ebe di elu. M'gēji abù to aha Chineke, M'gēji kwa ekele me ka Ọ di uku. Ọ gadi kwa Jehova mma kari ehi, Ma-ọbu oke-ehi nke nwere mpi, nke ukwu-ya wara njakpa. Ndi di ume-ala n'obi ahuwo ya, ha nāṅuri: Unu ndi nāchọ Chineke, ka obi-unu di ndu. N'ihi na Jehova nēge nti ndi-ob͕eye, Ọ ledaghi kwa ndi-nkpọrọ-Ya. Ka elu-igwe na ala to Ya, Ha na oké osimiri, na ihe ọ bula nke nākpughari nime ha. N'ihi na Chineke gāzọputa Zaion, wu kwa obodo nile nke Juda; Madu gēbi kwa n'ebe ahu, we nweta ya. Nkpuru nke ndi-orù-Ya gēketa kwa ya; Ndi nāhu aha-Ya n'anya gēbi kwa nime ya.

ABÙ ỌMA 69:19-36 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ị maara ihe niile banyere ihe ọchị ha ji m mee, mweda nʼala m na ihe ihere: ndị iro m niile nọkwa gị nʼihu. Ọchị ha na-achị m etiwaala m obi, ma hapụ m nʼọnọdụ enweghị inyeaka. Elere m anya onye ga-emere m ebere, ma ọ dịghị onye ọbụla m hụrụ; lee anya ndị ga-akasị m obi, ma ọ dịkwaghị onye m chọtara. Ha tinyere oluilu nʼime nri m, nyekwa m mmanya gbara ụka ka m ṅụọ. Ka tebul e debere nʼihu ha ghọrọ ha ọnya; ka ọ bụrụ ha ihe ịbọ ọbọ mgbe ha nọ nʼudo ya ghọrọ ha ọnya igbudu. Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ ọzọ, mekwa ka ụkwụ ha na-ama jijiji mgbe niile. Wụkwasị ha oke iwe gị, ka iwe gị dị ọkụ zute ha. Ka ebe obibi ha tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ụlọ ikwu ha. Ha na-akpagbu ndị ahụ i merụrụ ahụ, na-ekwukwa banyere ihe mgbu ndị ahụ i kwohịara ahụ. Boo ha ebubo ajọ omume tụkwasị nʼelu ajọ omume, ekwekwala ka ha keta oke na ezi omume gị. Mee ka e hichapụ aha ha site nʼakwụkwọ nke ndụ, ka a hapụ idekọta aha ha na nke ndị ezi omume. Anọ m nʼụfụ na ihe mgbu, O Chineke, mee ka nzọpụta gị kpuchie m. Aga m eji ịbụ abụ too aha Chineke, jirikwa ekele bulie ya elu. Nke a ga-atọ ONYENWE ANYị ụtọ karịa oke ehi, karịa oke ehi, nke mpi ya na ụkwụ ya ka dị. Ndị ogbenye ga-ahụ ya ma ṅụrịakwa ọṅụ; unu ndị na-achọ Chineke, ka obi unu na-adị ndụ. ONYENWE ANYị na-anụ ekpere ndị nọ na mkpa, ọ naghị eledakwa ndị ya a dọtara nʼagha anya. Ka eluigwe na ụwa too ya, osimiri niile na ihe niile bi nʼime ha. Nʼihi na Chineke ga-azọpụta Zayọn; ọ ga-ewugharị obodo niile nke Juda. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ebi nʼime ya, mee ya ihe nweta ha. Ụmụ ndị na-ejere ya ozi ga-eketa ya, ndị hụrụ aha ya nʼanya ga-ebikwa ebe ahụ nʼime ya.