ABÙ ỌMA 69:13-16
ABÙ ỌMA 69:13-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ONYENWE ANYị, ana m akpọku gị nʼekpere, nʼoge ihuọma gị; na oke ịhụnanya gị, O Chineke m, zaa m nʼeziokwu nke nzọpụta gị. Dọpụta m site nʼụrụrọ, ekwela ka m mikpuo; zọpụta m site nʼaka ndị kpọrọ m asị, site na mmiri miri emi. Ekwela ka uju mmiri kpuchie m, maọbụ ka ebe dị omimi loda m, ma ọ bụkwanụ ka olulu lomie m, kpuchie m nʼime ọnụ ya. O ONYENWE ANYị, zaa m, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, nʼime ịdị ukwuu nke oke ebere gị, chee m ihu.
ABÙ ỌMA 69:13-16 Bible Nso (IGBOB)
Ma mu onwem, anamekpere Gi ekpere, Jehova, na mb͕e ọ nātọ Gi utọ: Chineke, n'iba-uba nke ebere-Gi, Zam n'ezi-okwu nke nzọputa-Gi. Naputam n'apiti, ekwe-kwa-la ka m'mikpùe. Kwe ka anaputam n'aka ndi nākpọm asì, ka anaputakwam na miri nke miri emi. Ekwela ka miri nke nērù ọku ọku ṅachapum, Ekwe-kwa-la ka ebe di omimi lodam; Ekwe-kwa-la ka olùlù kpuchibidom ọnu-ya. Zam, Jehova; n'ihi na ebere-Gi di nma: Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di chem iru.