ABÙ ỌMA 66:17-20
ABÙ ỌMA 66:17-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Eji m ọnụ m kpọkuo ya; otuto ya dị m nʼire. Ọ bụrụ na mmehie na-amasị m nʼime obi m, Onyenwe anyị agaraghị ege m ntị; ma Chineke gere ntị nʼezie, nụrụkwa olu arịrịọ m. Otuto dịrị Chineke, onye na-ajụghị ekpere m maọbụ ghara izi m ịhụnanya ya!
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 66ABÙ ỌMA 66:17-20 Bible Nso (IGBOB)
Ya ka m'jiri ọnum kpọkue, Nbuli-elu di kwa n'okpuru irem. Ọ buru na ọ bu ajọ ihe ka m'leworo anya nime obim, Onye-nwe-ayi agaghi-anu olum: N'ezie Chineke anuwo olum; Ọ ṅawo nti olu ekerem. Onye agọziri agọzi ka Chineke bu, Onye nēwezugaghi ekperem, O sighi kwa n'ebe m'no wezuga ebere-Ya.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 66