ABÙ ỌMA 64:1-10
ABÙ ỌMA 64:1-10 Bible Nso (IGBOB)
Chineke, nuru olum n'itughari-uchem: Nēchezi ndum ka ọ pua n'oké egwu nke onye-iro. I gēzopum n'ìzù nzuzo nke ndi nēme ihe ọjọ: N'ìgwè ndi nālu ajọ ihe: Ndi muworo ire-ha dika mma-agha, Ha edowo àkú-ha, bú okwu di ilu: Ib͕a onye zuru okè àkú n'ebe nzuzo di iche iche: Na mberede ka ha nāb͕a ya, ha adighi-atu kwa egwu. Ha nēme okwu ọjọ ka ọ diri ha ike; Ha nākọ akukọ bayere isi ọnyà na nzuzo; Ha siri, Ònye gāhu ha? Ha nāchọputa ajọ omume nile, si, Ayi emezuwo nchọputa achọputara nke-ọma: Ọzọ, èchìchè-ime nke madu ọ bula nime ha na obi-ya miri emi. Ma Chineke nāb͕a ha àkú; Na mberede ka ntib͕u nile ha bu. Ewe me ka ha su ngọngọ, ebe ire nke aka ha nēmegide ha: Ha nēfufe isi, bú onye ọ bula nke nēlekwasi ha anya. Madu nile gātu kwa egwu; We gosi ọlu Chineke, Were uche chè èchìchè bayere omume-Ya. Onye ezi omume gāṅuri na Jehova, b͕abà kwa nime Ya; Ndi nile ndi ziri ezi n'obi gānya kwa isi.
ABÙ ỌMA 64:1-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nụrụ olu m O Chineke, mgbe m na-akọsara gị ihe na-esogbu m. Chebe ndụ m site nʼaka ndị iro m. Zopu m pụọ nʼizu nzuzo niile nke ndị ọjọọ, site nʼatụmatụ ndị na-eme ajọ ihe. Ha na-amụ ire ha dịka e si amụ mma agha, na-agbapụ okwu dịka àkụ ọjọọ. Ha na-agba onye na-enweghị ihe o mere àkụ site nʼebe nzuzo, na mberede ka ha na-agba ya, na-atụghị egwu. Ha na-agbarịta ibe ha ume na-atụmatụ ọjọọ, ha na-ekwu banyere isi ọnya ha na nzuzo, ha na-asị, “Onye ga-ahụ ya?” Ha na-atụpụta atụmatụ ọjọọ na-asị, “Anyị echepụtala atụmatụ zuruoke!” Nʼezie, uche na obi mmadụ dị aghụghọ. Ma Chineke ga-agba ha àkụ, na mberede ka a ga-etida ha. Ọ ga-atụgharị okwu ọnụ ha megide ha, mee ka ha laa nʼiyi; ndị niile hụrụ ha ga-efufe isi ha nʼịkwa emo. Mmadụ niile ga-atụ egwu, ha ga-ekwupụta ọrụ niile nke Chineke, ma tụgharịa uche nke ọma banyere ihe o mere. Ndị ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ nʼime ONYENWE ANYị, ha ga-agbabakwa nʼime ya; ndị niile obi ha ziri ezi ga-anyakwa isi nʼime ya.