ABÙ ỌMA 6:1-10
ABÙ ỌMA 6:1-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ONYENWE ANYị, abarala m mba mgbe ị na-ewe iwe. Atala m ahụhụ nʼoge ọnụma gị. Biko, meere m ebere ONYENWE ANYị, nʼihi na adịghị m ike. Gwọọ m, nʼihi na ọkpụkpụ m niile nọ nʼihe mgbu. Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ihe mgbu. Ruo ole mgbe, O ONYENWE ANYị, ka ị ga-anọgide na-agba m nkịtị? ONYENWE ANYị, biko, bịa zọpụta m; nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ, napụta m. Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị. O nwere onye na-eto gị site nʼala ili? Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude. Abalị niile, ana m eji ịkwa akwa mee ka ihe ndina m jupụta na mmiri, ana m eji anya mmiri dee ihe ndina m. Anya m adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ihe mwute; ọ kaala nka nʼihi mmeso ndị iro m. Sitenụ nʼebe m nọ wezuga onwe unu, unu ndị na-eme ajọ ihe, nʼihi na ONYENWE ANYị anụla akwa m niile. ONYENWE ANYị anụla akwa m; ọ nụla arịrịọ nke m na-arịọ ya ka o meere m ebere. Ọ nabatala ekpere m. Ka ndị iro m niile bụrụ ndị ihere ga-eme. Ha ga-ada mba, bụrụkwa ndị ga-eji ihere laghachi ebe ha si bịa.
ABÙ ỌMA 6:1-10 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, Abalaram nba n'iwe-Gi, Adọ-kwa-lam aka na nti n'ọnuma-Gi. Merem amara, Jehova; n'ihi na onye taworo aru ka m'bu: Mem ka m'diri ndu, Jehova; n'ihi na ọkpukpum nile nāma jijiji. Nkpuru-obim nāma kwa jijiji nke-uku: Ma Gi onwe-gi, Jehova, rùe ole mb͕e? Lata, Jehova, dọputa nkpuru-obim: Zọputam n'ihi ebere-Gi. N'ihi na ọ dighi ncheta-Gi di n'ọnwu: Nime ala-mọ ònye gēkele Gi? Adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ize-umem; Kwa-abali ka m'nēme ka ihe-ndinam se n'elu anya-mirim; Ejim anya-mirim de ihe m'ji edina. Anyam emebiwo site na nkpasu-iwem dika uwe nla mebiri; Ọ kawo nká n'hi ndi-nkpab͕um nile. Si n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu, unu nile ndi nālu ajọ ihe; N'ihi na Jehova anuwo olu ákwám. Jehova anuwo arirọ-amaram; Jehova gānara ekperem. Ihere gēme ndi-irom nile, ha gāma kwa jijiji nke-uku: Ha gālaghachi azu, ihere gēme ha na mberede.