ABÙ ỌMA 59:9-17
ABÙ ỌMA 59:9-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O, gị onye bụ ike m, ana m ele anya gị; gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike. Chineke m, onye m tụkwasịrị obi. Chineke ga-ebutere m ụzọ mekwaa ka m chịa ndị niile na-ekwulu m ọchị. O Onyenwe anyị na ọta anyị, egbukwala ha, ma ọ bụghị ya, ndị m ga-echefu. Were ike gị mee ka ha wagharịa, wedakwaa ha nʼala. Ka e jide ha nʼime nganga ha, nʼihi mmehie si ha nʼọnụ na-apụta, na nʼihi okwu ọnụ ha. Nʼihi okwu ọbụbụ ọnụ ha na okwu ụgha ha, jiri iwe ọkụ repịa ha, repịa ha ruo mgbe ha ga-aghọ ntụ. Mgbe ahụ, a ga-amata ruo na nsọtụ nke ụwa, na Chineke na-achị Jekọb. Nʼanyasị ha na-alaghachi; na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta, mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo. Ha na-awagharị na-achọ nri, na-etikwa mkpu ma ọ bụrụ na afọ ejughị ha. Ma aga m abụ abụ banyere ike gị, nʼụtụtụ aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị; ị bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, ebe mgbaba m nʼoge nsogbu. O, gị onye bụ ike m, ana m abụku gị abụ otuto; gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, Chineke m, onye m na-adabere.
ABÙ ỌMA 59:9-17 Bible Nso (IGBOB)
Ikem, Gi ka m'gēlezi anya: N'ihi na Chineke bu ulo-elum. Chineke nke eberem gābia izutem: Chineke gēme ka m'lekwasi ndi nēchem anwu anya. Eb͕ula ha, ka ndim ghara ichezọ: Were usu-ndi-agha-Gi me ka ha nāṅaghari, me kwa ka ha rida, Onye-nwe-ayi, bú ọta-ayi. Nmehie nke ọnu-ha ka okwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ha bu; Ka anwude kwa ha nime npako-ha, Na n'ihi ọb͕ub͕a-iyi na n'ihi okwu-ugha nke ha nākọ akukọ-ha. Me ka ha gwusia n'ọnuma-Gi, me ka ha gwusia, ka ha ghara idi ọzọ: Ka ha mara kwa na Chineke nāchi achi nime Jekob, Rue nsọtu nile nke uwa. Selah Ha nālaghachi kwa n'anyasi, nāb͕ọ uja dika nkita, Nāga obodo buruburu. Ndi ahu nāṅaghari iri ihe, Ọ buru na afọ ejughi ha ha gānọ kwa ọnọdu-abali. Ma mu onwem gābù abù bayere ike-Gi; E, m'gēti nkpu ọṅù bayere ebere-Gi n'ututu: N'ihi na I buruworom ulo-elu, Na ebe-nb͕alaga n'ubọchi nkpab͕u dirim. Ikem, Gi ka m'gābùku abù ọma: N'ihi na Chineke bu ulo-elum, bú Chineke nke eberem.