ABÙ ỌMA 57:9-11
ABÙ ỌMA 57:9-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche. Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu na-eru na mbara eluigwe; ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe. O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 57ABÙ ỌMA 57:9-11 Bible Nso (IGBOB)
M'gēkeli gi n'etiti ndi nile di iche iche, Onye-nwe-ayi: M'gābùku Gi abù ọma n'etiti mba nile. N'ihi na ebere-Gi di uku rue elu-igwe, Ezi-okwu-Gi di kwa uku rue mbara-ígwé. Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke; Ka ebube-Gi di n'elu uwa nile.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 57