ABÙ ỌMA 56:1-13
ABÙ ỌMA 56:1-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O Chineke, meere m ebere, nʼihi na ndị mmadụ ji ike na-achụso m; ogologo ụbọchị niile, ha na-ebu agha imegide m. Ogologo ụbọchị niile ndị iro m na-achụso m; site na nganga ha, ọtụtụ na-ebu agha megide m. Ma mgbe ụjọ na-atụ m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m. Nʼime Chineke onye m na-eto okwu ya, nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m. Gịnị ka mmadụ efu pụrụ ime m? Ogologo ụbọchị niile, ha na-asụgharị okwu m kwuru isi; oge niile ka ha na-atụ atụmatụ imerụ m ahụ. Ha na-agba izu nzuzo na-ezokwa onwe ha, ha na-enyochapụta nzọ ụkwụ m niile, dịkwa njikere ịnapụ m ndụ m. Nʼihi ajọ omume ha, ekwekwala ka ha gbapụ; o Chineke, nʼime iwe gị, wedaa mba ndị a niile dị iche iche nʼala. Depụta akwa arịrị m; chekọtasịa anya mmiri akwa m niile nʼime karama gị. Ọ bụ na ha adịghị nʼakwụkwọ ndepụta gị? Mgbe m ga-akpọku gị maka enyemaka, ndị iro m ga-agbaghachi azụ. Site nʼụzọ dị otu a, aga m amara na Chineke nọnyeere m. Nʼime Chineke, onye m na-eto okwu ya, nʼime ONYENWE ANYị, onye m na-eto okwu ya, nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m? O Chineke m, nʼisi m ka nkwa niile m kwere gị dị; aga m ewetara gị onyinye ekele m niile. Nʼihi na ị zọpụtala m site nʼọnwụ, ma napụta ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ, ka m nwee ike jegharịa nʼihu Chineke, nʼìhè nke ndụ.
ABÙ ỌMA 56:1-13 Bible Nso (IGBOB)
Merem amara, Chineke; n'ihi na madu ekusiwo ume ike ilom: Ogologo ubọchi nile ka o nēbu agha nēmeb͕um. Ndi nēchem anwu nēkusi ume ike ilom ogologo ubọchi nile: N'ihi na ha bara uba bú ndi nēbu agha imegidem n'ibuli onwe-ha elu. N'ubọchi m'nātu egwu, Mu onwem, ọ bu Gi ka m'gātukwasi obi. Nime Chineke ka m'gēto okwu-Ya: Ọ bu Chineke ka m'tukwasiworo obi, m'gaghi-atu egwu; Gini ka anu-aru, bú madu, gēmem? Ogologo ubọchi nile ka ha nāhighari okwum nile: N'imegidem èchìchè nile ha bu ime ihe ọjọ. Ha nēzukọ, nēzobe onwe-ha, Ndi ahu nēlezi ikiri-ukwum abua anya, Dika ha leworo anya nkpuru-obim. Ọ̀ bu n'ihi ajọ ihe ka ha nāb͕apu? N'iwu-Gi me ka ndi nile di iche iche rida, Chineke. Nwagharim ka Gi onwe-gi guworo ọnu: Tiye anya-mirim nile nime karama-akpukpọ-Gi; Hà adighi n'akwukwọ-Gi: Mb͕e ahu ndi-irom gālaghachi azu n'ubọchi m'gākpọku Gi: Nka ka m'mara, na Chineke dirim. Nime Chineke ka m'gēto okwu-Ya: Nime Jehova ka m'gēto okwu-Ya. Ọ bu Chineke ka m'tukwasiworo obi, m'gaghi-atu egwu; Gini ka anu-aru, bú madu, gēmem? N'isim, Chineke, ka nkwa nile m'kwere Gi di: M'gākwughachi Gi ekele nile. N'ihi na I naputawo nkpuru-obim n'ọnwu: Ì naputaghi ukwum abua na nnuda anēnudam? Ka m'we nējeghari n'iru Chineke N'ihè ndi ndu.