ABÙ ỌMA 51:2-5
ABÙ ỌMA 51:2-5 Bible Nso (IGBOB)
Sucham nke-ọma dika ákwà ka ajọ omumem pua nimem, Me kwa ka m'si na nmehiem di ọcha. N'ihi na mu onwem mara njehiem nile: Nmehiem di kwa n'irum mb͕e nile. Megide Gi, nání Gi, ka m'mehieworo, Ọ bu kwa ihe jọrọ njọ n'anya-Gi ka m'meworo: Ka I we buru onye ezi omume mb͕e I nēkwu okwu, Di kwa ọcha n'obi mb͕e I nēkpe ikpe. Le, n'ajọ omume ka amuputaram; Ọ bu kwa na nmehie ka nnem turu imem.
ABÙ ỌMA 51:2-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha. Nʼihi na amaara m njehie m niile, mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile. Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe. Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m; bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m.