ABÙ ỌMA 51:1-4
ABÙ ỌMA 51:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Merem amara, Chineke, dika ebere-Gi si di: Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di hichapu njehiem nile. Sucham nke-ọma dika ákwà ka ajọ omumem pua nimem, Me kwa ka m'si na nmehiem di ọcha. N'ihi na mu onwem mara njehiem nile: Nmehiem di kwa n'irum mb͕e nile. Megide Gi, nání Gi, ka m'mehieworo, Ọ bu kwa ihe jọrọ njọ n'anya-Gi ka m'meworo: Ka I we buru onye ezi omume mb͕e I nēkwu okwu, Di kwa ọcha n'obi mb͕e I nēkpe ikpe.
ABÙ ỌMA 51:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O Chineke, meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile. Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha. Nʼihi na amaara m njehie m niile, mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile. Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe.