Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 51:1-19

ABÙ ỌMA 51:1-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

O Chineke, meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile. Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha. Nʼihi na amaara m njehie m niile, mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile. Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe. Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m; bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m. Nʼezie, ị na-achọ eziokwu nʼakụkụ niile zoro ezo; ị na-akụziri m amamihe nʼakụkụ niile zoro ezo. Were hisọp sachaa m, aga m adị ọcha; sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo. Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ; ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa. Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị, hichapụkwa mmehie m niile. Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, nwogharịa ezi mmụọ nʼime m. Achụpụla m nʼihu gị, anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị. Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị, ma jiri ezi mmụọ kwagide m. Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị, ndị mmehie ga-echegharị lọghachikwute gị. O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara, Chineke, gị bụ Chineke Onye nzọpụta m, ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị. O, Onyenwe m, meghee ọnụ m, ka m kwupụta otuto gị. Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya. Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ. Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O Chineke, ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị. Ka ọ masị gị inye Zayọn ọganihu; i wulie mgbidi niile nke Jerusalem. Mgbe ahụ, a ga-enwe ezi aja, aja nsure ọkụ nke ga-atọ gị ụtọ; mgbe ahụ, a ga-achụkwa aja ọtụtụ oke ehi nʼelu ebe ịchụ aja gị.

ABÙ ỌMA 51:1-19 Bible Nso (IGBOB)

Merem amara, Chineke, dika ebere-Gi si di: Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di hichapu njehiem nile. Sucham nke-ọma dika ákwà ka ajọ omumem pua nimem, Me kwa ka m'si na nmehiem di ọcha. N'ihi na mu onwem mara njehiem nile: Nmehiem di kwa n'irum mb͕e nile. Megide Gi, nání Gi, ka m'mehieworo, Ọ bu kwa ihe jọrọ njọ n'anya-Gi ka m'meworo: Ka I we buru onye ezi omume mb͕e I nēkwu okwu, Di kwa ọcha n'obi mb͕e I nēkpe ikpe. Le, n'ajọ omume ka amuputaram; Ọ bu kwa na nmehie ka nnem turu imem. Le, ezi-okwu n'akuku nile di nime madu atọwo Gi utọ: Ọ bu kwa n'akuku zoro ezo ka i nēme ka m'mara amam-ihe. I gēwere hyssop wepu nmehiem, m'gādi kwa ọcha: I gāsucham dika ákwà, m'gādi kwa ọcha kari snow. I gēme ka m'nuru olu obi-utọ na ọṅù; Ka ọkpukpu nile I gwepiaworo we tegharia egwú-ọṅù. Zopu iru-Gi na nmehiem nile, Hichapu kwa ajọ omumem nile. Kèrem obi di ọcha, Chineke; Me kwa ka mọ nke nēguzosi ike di ọhu nimem. Atupulam n'iru Gi; Anara-kwa-lam Mọ Nsọ Gi. Nyeghachim obi-utọ nke nzọputa-Gi: Were kwa mọ nke amara aha-ya kwagidem. M'gēzí ndi-njehie uzọ-Gi nile; Ndi-nmehie gālaghachikute kwa Gi. Naputam n'aka ikpe-ọmuma ọbara di iche iche, Chineke, bú Chineke nke nzọputam; Irem gēti nkpu ọṅù bayere ezi omume-Gi. Onye-nwe-ayi, I gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum abua; Ọnum gēgosi kwa otuto-Gi. N'ihi na àjà adighi-atọ Gi utọ; ka m'we nye ya: Àjà-nsure-ọku adighi-atọ Gi utọ. Àjà nile nke Chineke bu mọ tiwara etiwa: Obi tiwara etiwa na nke egwepiara egwepia, Chineke, I dighi-eleda ya anya. Mere Zaion nma dika o si di Gi utọ: I gālu mb͕idi nile nke Jerusalem. Mb͕e ahu ka àjà nile nke ezi omume, bú àjà-nsure-ọku na àjà-nsuresi-ọku, gātọ Gi utọ: Mb͕e ahu ka ha gāchu ọtutu oke-ehi n'elu ebe-ichu-àjà-Gi.