ABÙ ỌMA 50:1-23
ABÙ ỌMA 50:1-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị, Chineke, Onye kachasị chi niile, ekwuola okwu ma kpọkọta ụwa niile, site na ọwụwa anyanwụ ruo na ọdịda ya. Chineke na-enwupụta dịka ìhè, site na Zayọn, nke zuruoke nʼime ịma mma. Chineke anyị na-abịa, ọ gaghị emechikwa ọnụ; ọkụ na-erepịa erepịa dị nʼihu ya, oke ifufe na-efesi ike gbakwara ya gburugburu. Ọ na-akpọku eluigwe na ụwa ka o kpee ndị ya ikpe: Ọ na-asị, “Chikọtaranụ m ndị m e doro nsọ, bụ ndị mụ na ha ji ịchụ aja gbaa ndụ.” Eluigwe na-ekwupụta ezi omume ya, nʼihi na Chineke nʼonwe ya bụ onye ikpe. Sela “Nụrụnụ, ndị m, m ga-ekwukwa, Izrel, aga m agba ama megide unu, Abụ m Chineke, Chineke unu. Anaghị m abara unu mba nʼihi ịchụ aja unu, na aja nsure ọkụ unu nke na-adị m nʼihu oge niile. Enweghị m mkpa maka oke ehi unu site nʼụlọ anụmanụ unu maọbụ mkpi site nʼọgba igwe ewu na atụrụ unu, nʼihi na ụmụ anụmanụ niile nke oke ọhịa bụ nke m, ha na ehi niile nọ nʼelu otu puku ugwu. Amaara m ụmụ nnụnụ niile nọ nʼelu ugwu niile, ihe niile e kere eke nọ nʼọhịa bụ nke m. Ọ bụrụ na agụụ agụọ m, agaghị m agwa gị ya, nʼihi na ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke m. Ana m ata anụ oke ehi, ka ọ bụ ọbara mkpi ka m ga-aṅụ? “Chụọrọ Chineke aja ekele, mezuo nkwa i kwere Onye kachasị ihe niile elu, ma kpọkuo m nʼụbọchị nsogbu gị, aga m agbapụta unu, unu ga-enyekwa m nsọpụrụ.” Ma Chineke na-agwa ndị na-eme ihe ọjọọ okwu sị, “Olee, nkwuwa okwu unu nwere ịgụgharị iwu m, maọbụ kwupụta ọgbụgba ndụ m nʼọnụ unu? Unu kpọrọ ndụmọdụ m asị, na-atụfekwa okwu m nʼazụ unu. Mgbe unu hụrụ onye ohi, unu na ya na-ejikọta aka; unu na ndị na-akwa iko na-ekekọkwa oke. Ọnụ unu na-eme ọsịịsọ ikwu okwu ọjọọ, okwu aghụghọ na nke rere ure na-esikwa nʼọnụ unu na-asọpụta dịka iyi. Unu na-ekwugide ụmụnna unu mgbe niile, na-ekwutọkwa nwanne unu nwoke. Ihe ndị a ka unu mere ma agbachiri m nkịtị; unu chekwara na adị m ka unu. Ma aga m abara unu mba ma bokwaa unu ebubo unu nʼihu unu. “Tụgharịa uche na nke a, unu ndị na-echefu Chineke, ma ọ bụghị ya, aga m adọrisi unu, ọ dịkwaghị onye ga-agbapụta unu. Onye na-eji ekele achụrụ m aja, na-asọpụrụ m, ọ bụkwa onye na-edozi ụzọ ya, ka m ga-eme ka ọ hụ nzọpụta Chineke.”
ABÙ ỌMA 50:1-23 Bible Nso (IGBOB)
Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, ekwuwo, We kpọ uwa site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya. Site na Zaion, bú ebe mazuru nma, Ka Chineke nwuputaworo ka ìhè. Ka Chineke-ayi bia, Ya ab͕a-kwa-la nkiti: Ọku nēripia n'iru Ya, Buruburu Ya ka ifufe nēfesi kwa ike nke-uku. Ọ nākpọ elu-igwe nke di n'elu òkù, Nākpọ kwa uwa, ka O we kpe ndi-Ya ikpe: Chikọtaranum ndi-eberem; Bú ndi Mu na ha b͕ara ndu n'elu àjà. Elu-igwe nēgosi kwa ezi omume-Ya; N'ihi na Chineke onwe-ya nēkpe ikpe. Selah Nuru, ndim, M'gēkwu kwa; Nuru, Israel, M'gāb͕a kwa àmà megide gi: Chineke, bú Chineke-gi, ka M'bu. Ọ bughi n'ihi àjà-gi nile ka M'nābara gi nba; Àjà-nsure-ọku-gi nile di kwa n'irum mb͕e nile. M'gaghi-anara oke-ehi n'ulo-gi, M'gaghi-anara nkpi ọ bula n'ogige-ewu-na-aturu-gi. N'ihi na Mu nwe anu-ọhia ọ bula nke oké ọhia, Ya na anu nile n'elu nnù ugwu abua na ọgu iri. Amawom anu-ufe ọ bula nke ugwu nile: Anu nile nke nēnughari n'ọhia di kwa n'akam. Ọ buru na agu aguam, M'gaghi-agwa gi: N'ihi na Mu nwe elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya. M'gēri anu oke-ehi? Ọ̀ bu ọbara nkpi ka m'gāṅu? Chuara Chineke ekele dika àjà; Kwughachi kwa Onye kachasi ihe nile elu nkwa nile i kwere: Kpọkukwam n'ubọchi nkpab͕u; M'gādọputa gi, i gāsọpu-kwa-ram. Ma ndi nēmebi iwu ka Chineke gwara okwu, si, Òle ọlu-gi di ya n'ikọ ukpurum nile? Òle ọlu-gi di kwa ya na i būruwo ọb͕ub͕a-ndum n'ọnu-gi? Ebe gi onwe-gi kpọworo idọ-aka-na-nti asì, We tufue okwum nile n'azu gi. Ọ buru na i hu onye-ori, ihe-ya we tọ gi utọ, Gi na ndi nākwa iko ekèkọwo kwa òkè. I rarawo ọnu-gi nye n'ikwu ihe ọjọ, Ire-gi nējikọta kwa aghughọ. I nānọdu ala, nwa-nne-gi ka i nēkwu okwu megide; Nwa nke nne-gi muru ka i nēbo ebubo ugha. Ihe ndia ka i meworo, M'we b͕a nkiti; I chère na adizum ka i di: M'gābara gi nba, do kwa ya n'usoro n'anya-gi. Biko, ghọtanu nka, unu ndi nēchezọ Chineke, Ka m'we ghara idọka unu, ọ dighi kwa onye-nnaputa diri unu: Onye nāchu ekele dika àjà nāsọpurum; Ọ bu kwa onye nēdozi uzọ-ya Ka m'gēme ka ọ hu nzọputa Chineke.