ABÙ ỌMA 48:1-3
ABÙ ỌMA 48:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto, nʼime obodo Chineke anyị, nʼugwu nsọ ya. Ọ mara mma nʼịdị elu ya, bụkwa ọṅụ elu ụwa niile. Ugwu Zayọn, obodo eze ahụ dị ukwuu, dịka ebe kachasị elu nke Zafọn. Chineke nọ nʼime ebe ya e wusiri ike; o gosila onwe ya dịka ebe mgbaba ha e wusiri ike.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 48ABÙ ỌMA 48:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku, N'obodo Chineke-ayi, bú ugwu nsọ Ya. Ihe mara nma n'idi-elu, na ihe-obi-utọ nke uwa nile, Ka ugwu Zaion bu, n'akuku nile nke Ugwu, Bú obodo Eze ukwu. Chineke Nke nọ n'ulo nile ya di elu emewo ka amara Ya na Ya bu ulo-elu.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 48