ABÙ ỌMA 48:1-14
ABÙ ỌMA 48:1-14 Bible Nso (IGBOB)
Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku, N'obodo Chineke-ayi, bú ugwu nsọ Ya. Ihe mara nma n'idi-elu, na ihe-obi-utọ nke uwa nile, Ka ugwu Zaion bu, n'akuku nile nke Ugwu, Bú obodo Eze ukwu. Chineke Nke nọ n'ulo nile ya di elu emewo ka amara Ya na Ya bu ulo-elu. N'ihi na, le, ndi-eze zukọro, Ha gabigara n'otù. Ha onwe-ha huru ya, ibobo we nwua ha n'aru; Ha mara jijiji, zọlie ọsọsọ. Ọma-jijiji jidere ha n'ebe ahu; Ihe-nb͕u, dika nke nwayi nāmuputa nwa. I ji ifufe Iru-anyanwu Tiwa ub͕ọ nile nke Tashish. Dika ayi nuworo, otú a ka ayi huworo N'obodo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'obodo Chineke-ayi: Chineke gēme ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi. Selah Ayi echèwo ebere-Gi echè, Chineke, N'etiti ulo uku Gi. Dika aha-Gi si di, Chineke, Otú a ka otuto-Gi di rue nsọtu nile nke uwa: Ezi omume juputara aka-nri-Gi. Ka ugwu Zaion ṅuria ọṅu, Ka umu-ndinyom Juda tegharia egwú ọṅù, N'ihi ikpé-Gi nile. Jenu Zaion buruburu, b͕a kwa ya buruburu: Guanu ulo-elu-ya nile ọnu. Tukwasinu obi-unu n'ékpè-ya, Tulenu ulo nile ya di elu; Ka unu we kọrọ ọb͕ọ nēso n'azu. N'ihi na Nka bu Chineke, bú Chineke-ayi, rue mb͕e nile ebighi-ebi; Ya onwe-ya ganēdu ayi rue n'inwu-ọnwu.
ABÙ ỌMA 48:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto, nʼime obodo Chineke anyị, nʼugwu nsọ ya. Ọ mara mma nʼịdị elu ya, bụkwa ọṅụ elu ụwa niile. Ugwu Zayọn, obodo eze ahụ dị ukwuu, dịka ebe kachasị elu nke Zafọn. Chineke nọ nʼime ebe ya e wusiri ike; o gosila onwe ya dịka ebe mgbaba ha e wusiri ike. Mgbe ndị eze jikọtara ndị agha ha ọnụ, mgbe ha bịakọtara nso, ihe ha hụrụ juru ha anya; nʼihi oke egwu, ha gbara ọsọ. Ahụ ọma jijiji bidoro ha nʼebe ahụ, ihe mgbu ha dịka nke nwanyị na-achọ ịmụ nwa. Ị lara ha nʼiyi dịka oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ si ala ụgbọ mmiri ukwuu nke Tashish nʼiyi. Dịka anyị nụrụ, otu a ka anyị hụrụ, nʼime obodo ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, nʼime obodo Chineke anyị: Chineke na-eme ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. Sela O Chineke, nʼime ụlọnsọ ukwuu gị, ka anyị nọ na-atụgharị uche nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ. O Chineke, dịka aha gị, otuto gị na-eru na nsọtụ ụwa niile; aka nri gị jupụtara nʼezi omume. Ugwu Zayọn na-aṅụrị ọṅụ, obodo nta niile nke Juda nwere obi ụtọ nʼihi ikpe gị niile. Gaanụ Zayọn gburugburu, Jegharịa ya gburugburu, gụọkwanụ ụlọ elu ya niile ọnụ. Lezienụ mgbidi ya niile anya, nyochakwaanụ ebe ya niile e wusiri ike, ka unu nwee ike ịkọrọ ọgbọ na-abịa nʼihu akụkọ ndị a. Nʼihi na Chineke a, bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi, ọ ga-abụ onyendu anyị, ọ bụladị ruo nʼọgwụgwụ.