ABÙ ỌMA 44:1-8
ABÙ ỌMA 44:1-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O Chineke, anyị anụla; nna anyị ha agwakwala anyị ihe ndị i mere nʼoge ha, nʼoge gara aga. I ji aka gị chụpụ ndị mba ọzọ, ma kụnye nna nna anyị ha dịka osisi. I gwepịara ndị ahụ ma mee ka ndị nna anyị na-eto na-awasa. Ọ bụghị site na mma agha ha ka ha ji merie nweta ala a, ha emerighị site nʼike nke aka ha; ọ bụ aka nri gị, aka gị, na ìhè nke ihu gị nyere ha mmeri, nʼihi na ị hụrụ ha nʼanya. Ị bụ eze m na Chineke m, onye na-ekpebi na Jekọb aghaghị inwe mmeri. Nʼihi ọ bụ naanị site nʼike gị, ya na aha gị, ka anyị ji zọda ndị iro anyị nʼokpuru ụkwụ anyị. Atụkwasịghị m obi m nʼụta m, mma agha m anaghị enye m mmeri; ma i na-enye anyị mmeri nʼebe ndị iro anyị nọ, ị na-eme ka ihere mee ndị na-eguzogide anyị. Nʼime Chineke ka ịnya isi anyị dị ogologo ụbọchị niile, anyị ga-eto aha gị ruo mgbe ebighị ebi. Sela
ABÙ ỌMA 44:1-8 Bible Nso (IGBOB)
Chineke, ayi ewerewo nti-ayi nu, nna-ayi-hà akọworo ayi, Ọlu I luru n'ubọchi-ha, n'ubọchi mb͕e ochie. Gi onwe-gi jiri aka-gi napu mba ọzọ di iche iche ala-ha, we kua ha dika osisi nime ya; I nēmejọ ndi nile di iche iche, we me ka nna-ayi-hà wasa alaka. N'ihi na ọ bughi mma-agha-ha ka ha ji nweta ala ahu, Ogwe-aka-ha azọputaghi kwa ha: Kama ọ bu aka-nri-Gi, na ogwe-aka-Gi, na ìhè nke iru-Gi, N'ihi na ihe-ha tọrọ Gi utọ. Gi onwe-gi bu Ezem, Chineke: Nye nzọputa nile nke Jekob iwu. Site na Gi ka ayi ga-akwatu ndi nākpab͕u ayi: Site n'aha-Gi ka ayi gāzọkwasi ndi nēbili imegide ayi ukwu. N'ihi na ọ bughi utam ka m'nātukwasi obi, Mma-agham adighi-azọputakwam. Kama ọ bu Gi zọputaworo ayi n'aka ndi nākpab͕u ayi, I mewo kwa ka ihere me ndi nākpọ ayi asì. Chineke ka ayi jiworo nya isi ogologo ubọchi nile, Ọ bu kwa aha-gi ka ayi gēkele rue mb͕e ebighi-ebi. Selah