ABÙ ỌMA 43:1-5
ABÙ ỌMA 43:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O Chineke, kpepụta m, kpechitere m ikpe m nʼebe mba na-amaghị Chineke nọ; gbapụta m site nʼaka ndị ajọ omume na ndị aghụghọ. Ị bụ Chineke, ebe m e wusiri ike. Gịnị mere i ji jụ m? Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ, nʼihi mmegbu nke onye iro? Zipụ ìhè gị na eziokwu gị, ka ha duo m; ka ha kpọbata m nʼugwu nsọ gị, bụ ebe i bi. Mgbe ahụ, aga m aga nʼebe ịchụ aja Chineke, gakwuru Chineke, bụ ọṅụ m na obi ụtọ m. Aga m eji ụbọ akwara too gị, O Chineke, bụ Chineke m. O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ, onye Nzọpụta m na Chineke m.
ABÙ ỌMA 43:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Kpem ikpe, Chineke, kpe kwa ọnum n'ikpe, me ka m'pua n'aka mba nādighi-eme ebere: Me ka m'si n'aka nwoke bu onye-aghughọ na onye ajọ omume b͕apu. N'ihi na Gi onwe-gi bu Chineke Nke bu ebem siri ike; n'ìhi gini ka I juworom aju? N'ihi gini ka m'nējeghari nēyi uwe-nkpe nime nmeb͕u onye-iro? Ziputa ìhè-Gi na ezi-okwu-Gi; ka ha onwe-ha nēdum: Ka ha me ka m'biarue ugwu nsọ Gi, Biaru kwa ebe-obibi-Gi nile. M'gābiaru kwa ebe-ichu-àjà nke Chineke, Rue Chineke aru, bú ọṅù nke otite-egwú-ọṅùm: M'gēkele kwa Gi n'ubọ-akwara, Chineke, bú Chinekem. Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim? Gini mere i ji su ude nke-uku nimem? Chere Chineke: n'ihi na m'gēkele kwa Ya ọzọ, Onye bu nzọputa nke irum, na Chinekem.