ABÙ ỌMA 40:9-17
ABÙ ỌMA 40:9-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi; dịka ị maara, o ONYENWE ANYị, anaghị m emechi ọnụ m. Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m, ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị. Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị, nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ. O ONYENWE ANYị, ezonarịla m ebere gị, ka ịhụnanya gị na eziokwu gị chebe m oge niile. Nʼihi na ọtụtụ nsogbu a na-apụghị ịgụta ọnụ gbara m gburugburu; mmehie m niile akarịala m, apụghịkwa m ịhụ ụzọ: ha karịrị agịrị isi dị m nʼisi, obi m na-adakwa mba nʼime m. O ONYENWE ANYị, ya masị gị ịzọpụta m; O ONYENWE ANYị, bịa ngwangwa inyere m aka. Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara; ka ndị niile ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m, laghachi azụ nʼihere. Ka ndị ahụ na-asị m, “Ehee! Ehee!” kụja nʼihi ihere onwe ha. Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị; ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “ONYENWE ANYị dị ukwuu.” Ma mụ onwe m bụ m ogbenye na onye nọ na mkpa; ka ONYENWE ANYị cheta m. Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m; Ị bụ Chineke m, anọla ọdụ ịbịa.
ABÙ ỌMA 40:9-17 Bible Nso (IGBOB)
Ezisawom ozi ọma nke ezi omume nime nkpọkọta-Gi bara uba; Le, adighm-eb͕ochi eb͕ub͕ere-ọnum abua, Jehova, Gi onwe-gi amawo. Ekpuchighm ezi omume-Gi nime obim; Ekwusawom ikwesi-ntukwasi-obi-Gi na nzọputa-Gi: Ezonarighm nkpọkọta-Gi bara uba ebere-Gi na ezi-okwu-Gi Gi onwe-gi, Jehova, ebochilaram obi-ebere-Gi nile: Ka ebere-Gi na ezi-okwu-Gi nēchezim mb͕e nile. N'ihi na ihe ọjọ nādighi ọnu-ọgugu ab͕awom buruburu, Ajọ omumem nile eruwom aru, apughkwam ihu uzọ; Ha kariri agiri-isi nile nke isim n'uba, obim arapuwokwam. Jehova, ka ọ tọ Gi inaputam: Jehova, bia ọsọsọ iyerem aka. Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù, Bú ndi nāchọ nkpuru-obim ikpochapu ya: Ka ha laghachi azu, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, Bú ndi ihe ọjọ dakwasirim nātọ utọ. Ka ha tọb͕ọrọ n'efu n'ihi ihere-ha, Bú ndi nāsim, Ehe, ehe. Ka obi tọ ndi nile nke nāchọ Gi utọ, ka ha ṅuri kwa ọṅu nime Gi: Ka ndi nāhu nzọputa-Gi n'anya nāsi mb͕e nile, Ka Jehova di uku. Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na ob͕eye; Ma Onye-nwe-ayi nēchèrem èchìchè: Onye-iye-akam na Onye nēme ka m'b͕apu ka I bu; Chimekem, anọla ọdù.