ABÙ ỌMA 40:1-4
ABÙ ỌMA 40:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Eji m ndidi chere ONYENWE ANYị, ọ tụgharịkwutere m, ọ nụkwaara akwa m. O sitere nʼolulu na-amị amị, nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m; o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume, nyekwa m ebe siri ike ka m guzo. O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m, abụ otuto nye Chineke anyị. Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu, ha ga-atụkwasị obi ha nʼime ONYENWE ANYị. Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye na-eme ONYENWE ANYị ebe ntụkwasị obi ya; onye na-adịghị ele ndị mpako anya maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.
ABÙ ỌMA 40:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Elesirim anya Jehova ike; Ọ we tọrọm nti-Ya n'ala, nu ntikum. Ọ we me ka m'si n'olùlù nbibi, n'apiti nke ala urọ, rigoputa; Ọ we me ka ukwum abua guzo n'elu nkume di elu, Ọ nēme ka nzọ-ukwum nile guzosie ike. Ọ we tiye abù ọhu n'ọnum, bú otuto diri Chineke-ayi: Ọtutu madu gāhu ya, tua egwu, We tukwasi Jehova obi. Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke meworo Jehova ka Ọ buru ihe-ntukwasi-obi-ya, Ọ cheghi kwa ndi-nganga iru, ma-ọbu ndi nējehi n'uzọ okwu-ugha.