ABÙ ỌMA 36:5-10
ABÙ ỌMA 36:5-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ONYENWE ANYị, ịhụnanya gị na-eru mbara eluigwe, ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa igwe ojii nke eluigwe. Ezi omume gị dịka ugwu dị ukwuu, ikpe ikpe ziri ezi gị dịka omimi nke oke osimiri. O ONYENWE ANYị, ị na-echebe ụmụ mmadụ na anụmanụ. Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O Chineke! Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ. Ha na-eri oriri site nʼịba ụba nke ụlọakụ gị; Ị na-enyekwa ha mmiri site nʼiyi nke obi ụtọ gị. Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị; ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè. Mee ka ịhụnanya gị na-adịgidere ndị maara gị, ka ezi omume gị na-adịgidekwara ndị ziri ezi nʼobi.
ABÙ ỌMA 36:5-10 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, n'elu-igwe ka ebere-Gi di; Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nēru mbara-ígwé. Ezi omume-Gi di ka ugwu Chineke; Ikpé-Gi nile bu ob͕u-miri riri nne: Ọ bu madu na anumanu ka I nāzọputa, Jehova. Le ka ebere-Gi si di oké ọnu-ahia, Chineke! Umu madu nāb͕abá kwa n'okpuru ǹdò nkù-Gi abua. Afọ nējubiga ha ókè site n'abuba nke ulo-Gi; Ọ bu kwa miri-iyi nke ihe-utọ-Gi nile ka I nēme ka ha ǹua. N'ihi na n'ebe I nọ ka isi-iyi ndu di: N'ìhè-Gi ka ayi nāhu ìhè. Me ka ebere-Gi digidere ndi mara Gi; Me kwa ka ezi omume-Gi digidere ndi ziri ezi n'obi.