Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 34:17-22 - Compare All Versions

ABÙ ỌMA 34:17-22 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

ONYENWE ANYị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka; ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile. ONYENWE ANYị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ. Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu, ma ONYENWE ANYị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile. Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam. Ọ gaghị ekwe ka ọ bụladị otu ọkpụkpụ dị ha nʼahụ gbajie. Ihe ọjọọ ga-eme ka onye ajọ omume nwụọ; ndị na-akpọ onye ezi omume asị ka a ga-ama ikpe ọnwụ. ONYENWE ANYị na-agbapụta ndị ohu ya; ọ dịghị onye ọbụla nke na-agbaba nʼime ya a ga-ama ikpe ọnwụ.

ABÙ ỌMA 34:17-22 IGBOB (Bible Nso)

Ndi ezi omume tiri nkpu, Jehova we nuru, We si na nkpab͕u-ha nile naputa ha. Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa, Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha. Ha di ọtutu, bú ihe ọjọ nke nādakwasi onye ezi omume: Ma n'aka ha nile ka Jehova nānaputa ya. Ọ nēdebe ọkpukpu-ya nile: Ọ dighi otù nime ha nyajiri anyaji. Ihe ọjọ gēme ka onye nēmebi iwu nwua: Ọzọ, ndi nākpọ onye ezi omume asì, agāma ha ikpe. Jehova nāb͕aputa nkpuru-obi ndi-orù-Ya: Agaghi-ama kwa ha ikpe, bú ndi nile nāb͕abà nime Ya.