ABÙ ỌMA 34:17-19
ABÙ ỌMA 34:17-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka; ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile. ONYENWE ANYị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ. Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu, ma ONYENWE ANYị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 34ABÙ ỌMA 34:17-19 Bible Nso (IGBOB)
Ndi ezi omume tiri nkpu, Jehova we nuru, We si na nkpab͕u-ha nile naputa ha. Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa, Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha. Ha di ọtutu, bú ihe ọjọ nke nādakwasi onye ezi omume: Ma n'aka ha nile ka Jehova nānaputa ya.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 34