ABÙ ỌMA 34:11-22
ABÙ ỌMA 34:11-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ụmụ m, bịanụ gee m ntị; aga m ezi unu ihe ịtụ egwu ONYENWE ANYị bụ. Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya, ma nwee ọchịchọ ihu ọtụtụ ụbọchị ndị dị mma, chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ, chezikwaa egbugbere ọnụ gị ka ọ gharakwa ịgha ụgha. Site nʼihe ọjọọ wezuga onwe gị ma mee ezi ihe, chọọ udo ma gbasookwa ya. Anya ONYENWE ANYị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye mkpu akwa ha; ma ihu ONYENWE ANYị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ, ime ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha nʼụwa. ONYENWE ANYị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka; ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile. ONYENWE ANYị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ. Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu, ma ONYENWE ANYị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile. Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam. Ọ gaghị ekwe ka ọ bụladị otu ọkpụkpụ dị ha nʼahụ gbajie. Ihe ọjọọ ga-eme ka onye ajọ omume nwụọ; ndị na-akpọ onye ezi omume asị ka a ga-ama ikpe ọnwụ. ONYENWE ANYị na-agbapụta ndị ohu ya; ọ dịghị onye ọbụla nke na-agbaba nʼime ya a ga-ama ikpe ọnwụ.
ABÙ ỌMA 34:11-22 Bible Nso (IGBOB)
Bianu, umum, gem nti: Egwu Jehova ka m'gēzi unu. Ònye bu nwoke ahu nke ndu nātọ ya utọ, Nke nāhu ubọchi nile nke ndu n'anya, ka o we hu ọdi-nma? Chezi ire-gi ka ọ ghara ikwu ihe ọjọ, chezi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi ka ha ghara ikwu okwu aghughọ. Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe; Nāchọsi udo ike, b͕aso kwa ya. Anya abua nke Jehova di n'aru ndi ezi omume, Nti-Ya abua ghe-kwa-ra oghe na nkpu ha nētiku Ya. Iru Jehova nēmegide ndi nēme ihe ọjọ, Ibipu ncheta-ha n'uwa. Ndi ezi omume tiri nkpu, Jehova we nuru, We si na nkpab͕u-ha nile naputa ha. Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa, Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha. Ha di ọtutu, bú ihe ọjọ nke nādakwasi onye ezi omume: Ma n'aka ha nile ka Jehova nānaputa ya. Ọ nēdebe ọkpukpu-ya nile: Ọ dighi otù nime ha nyajiri anyaji. Ihe ọjọ gēme ka onye nēmebi iwu nwua: Ọzọ, ndi nākpọ onye ezi omume asì, agāma ha ikpe. Jehova nāb͕aputa nkpuru-obi ndi-orù-Ya: Agaghi-ama kwa ha ikpe, bú ndi nile nāb͕abà nime Ya.