ABÙ ỌMA 34:1-4
ABÙ ỌMA 34:1-4 Bible Nso (IGBOB)
M'gāgọzi Jehova na mb͕e nile: Mb͕e nile ka otuto-Ya gādi n'ọnum. Jehova ka nkpuru-obim gēji nya isi: Ndi di ume-ala n'obi gānu ya, we ṅuria ọṅu. Sonum me ka Jehova di uku, Ka ayi buli kwa aha-Ya elu n'otù. Achọrọm Jehova, Ọ za-kwa-ram, We naputam n'ujọm nile.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 34ABÙ ỌMA 34:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Aga m eto ONYENWE ANYị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m. Mkpụrụobi m ga-anya isi na ONYENWE ANYị; ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ. Soro m too ONYENWE ANYị; ka anyị bulie aha ya elu. Nʼihi na etikuru m ONYENWE ANYị mkpu akwa, ọ zakwara m, napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 34