ABÙ ỌMA 34:1-10
ABÙ ỌMA 34:1-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Aga m eto ONYENWE ANYị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m. Mkpụrụobi m ga-anya isi na ONYENWE ANYị; ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ. Soro m too ONYENWE ANYị; ka anyị bulie aha ya elu. Nʼihi na etikuru m ONYENWE ANYị mkpu akwa, ọ zakwara m, napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile. Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe; ihere adịghị eme ha. Onye ogbenye a kpọkuru ONYENWE ANYị, ọ zakwara ya; ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile. Mmụọ ozi ONYENWE ANYị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu na-anapụtakwa ha. Jiri aka gị tulee ma hụkwa na ONYENWE ANYị dị mma; onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya. Tụọnụ egwu ONYENWE ANYị, unu ndị nsọ ya, nʼihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị niile na-atụ egwu ya. Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha, ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ ONYENWE ANYị.
ABÙ ỌMA 34:1-10 Bible Nso (IGBOB)
M'gāgọzi Jehova na mb͕e nile: Mb͕e nile ka otuto-Ya gādi n'ọnum. Jehova ka nkpuru-obim gēji nya isi: Ndi di ume-ala n'obi gānu ya, we ṅuria ọṅu. Sonum me ka Jehova di uku, Ka ayi buli kwa aha-Ya elu n'otù. Achọrọm Jehova, Ọ za-kwa-ram, We naputam n'ujọm nile. Ha legidere Ya anya, we nwue enwu: Ka ihere ghara ime kwa ha n'iru. Onye a ewedara n'ala kpọrọ òkù, Jehova we nuru ya, We si na nkpab͕u-ya nile zọputa ya. Mọ-ozi nke Jehova nāma ulo-ikwū-ya buruburu ndi nātu egwu Ya, Ọ we dọputa ha. Detunu ire, hu na Jehova di nma: Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke nāb͕abà nime Ya. Tuanu egwu Jehova, unu ndi nsọ Ya: N'ihi na ọ dighi ihe nākọ ndi nātu egwu Ya. Nkpà akpawo umu-ọdum, agu aguwo kwa ha: Ma ndi nāchọ Jehova, ọ dighi ezi ihe ọ bula gākọ ha.