ABÙ ỌMA 31:1-5
ABÙ ỌMA 31:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị, nʼime gị, ka m gbabara izere ndụ; ekwela ka ihere mee m; site nʼezi omume gị gbapụta m. Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m, bịa ngwangwa gbapụta m; ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m. Ebe ị bụ oke nkume m na ebe mgbaba m e wusiri ike, nʼihi aha gị, duo m ma na-edukwa m. Napụta m site nʼọnya nke e zobere nʼihi m, nʼihi na ọ bụ naanị gị bụ ebe mgbaba m siri ike. Nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m; gbapụta m, o ONYENWE ANYị, Chineke, onye eziokwu.
ABÙ ỌMA 31:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Nime Gi, Jehova, ka m'b͕abàworo; ekwela ka ihere mem rue mb͕e ebighi-ebi: N'ezi omume-gi me ka m'b͕apu. Tọrọm nti-Gi n'ala; naputam ngwa ngwa: Ghọrọm oké nkume nke ebe siri ike, bú ulo nke ebe ewusiri ike nke-uku izọputam. N'ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu; Ọzọ, n'ihi aha-Gi I gēdum, dukwam nwayo. I gēme ka m'si n'ub͕u nke ha zoberem puta; N'ihi na Gi onwe-gi bu ebem siri ike. N'aka-Gi ka m'nēnye mọm idebe: I b͕aputawom, Jehova, Chineke nke ezi-okwu.