ABÙ ỌMA 30:8-12
ABÙ ỌMA 30:8-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụ gị, ONYENWE ANYị, ka m kpọkuru; ọ bụkwa onyenwe anyị ka m rịọrọ arịrịọ amara sị, “Uru gịnị dị ma m laa nʼiyi? Uru gịnị dị ma m rịda nʼili? Uzuzu aja ọ ga-enye gị otuto? Ọ ga-ekwusa banyere ikwesi ntụkwasị obi gị?” O ONYENWE ANYị, gee m ntị ma meere m ebere; O ONYENWE ANYị, bụụrụ m onye inyeaka. I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu; ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme. I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ. O ONYENWE ANYị Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.
ABÙ ỌMA 30:8-12 Bible Nso (IGBOB)
Gi, Jehova, ka m'nākpọku; Ọ bu kwa Onye-nwe-ayi ka m'nāriọ aririọ-amara: Ùrù gini di n'ọbaram, mb͕e m'na-arida n'olùlù? Ájá, ọ̀ gēkele Gi? ò gēgosi ezi-okwu-Gi? Nuru, Jehova, me-kwa-ram amara: Jehova, buru onye nēyerem aka. I b͕anweworom iti-aka-n'obim ka ọ ghọ ite-egwú; I tọpuwo ákwà-nkpem, were ọṅù kem dika ihe-ọkiké: Ka nsọpurum we bùkue Gi abù ọma, ghara idere du. Jehova, bú Chinekem rue mb͕e ebighi-ebi ka m'gēkele Gi.