ABÙ ỌMA 30:1-12
ABÙ ỌMA 30:1-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Aga m eto gị, O ONYENWE ANYị, nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m. I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị. O ONYENWE ANYị Chineke m, akpọkuru m gị, ka i nyere m aka, ị gwọkwara m. O ONYENWE ANYị, i si nʼala ili kpọpụta m, i mere ka m dịrị ndụ. Bụkuonụ ONYENWE ANYị abụ, unu ndị nsọ ya, toonu aha nsọ ya. Iwe ya adịghị adịgide tee anya, ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi! Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile, ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ. Mgbe m nọ nʼudo, asịrị m, “Ihe ọbụla apụghị ịnapụ m udo m.” O ONYENWE ANYị, mgbe i gosiri m ihuọma, i mere ka m kwụrụ chịm dịka ugwu; ma mgbe i zoro ihu gị site nʼebe m nọ, adara m mba. Ọ bụ gị, ONYENWE ANYị, ka m kpọkuru; ọ bụkwa onyenwe anyị ka m rịọrọ arịrịọ amara sị, “Uru gịnị dị ma m laa nʼiyi? Uru gịnị dị ma m rịda nʼili? Uzuzu aja ọ ga-enye gị otuto? Ọ ga-ekwusa banyere ikwesi ntụkwasị obi gị?” O ONYENWE ANYị, gee m ntị ma meere m ebere; O ONYENWE ANYị, bụụrụ m onye inyeaka. I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu; ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme. I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ. O ONYENWE ANYị Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.
ABÙ ỌMA 30:1-12 Bible Nso (IGBOB)
M'gēbuli Gi elu, Jehova; n'ihi na I dọgowom n'elu, I meghi kwa ka ndi-irom ṅuriam. Jehova, bú Chinekem, Etikurum, I, I we me ka m'diri ndu. Jehova, I mewo ka nkpuru-obim si n'ala-mọ rigoputa: I mewo ka m'si n'etiti ndi nārida n'olùlù di ndu. Bùkuenu Jehova abù ọma, unu ndi-ebere-Ya, Kele-kwa-nu ihe-ncheta-Ya di nsọ. N'ihi na nání otù ntabi-anya nāgabiga n'iwe-Ya; Ogologo ndu nile nāgabiga na mb͕e ihe-ayi nātọ Yautọ: N'anyasi ikwa-ákwá gābia inọ ọnọdu-abali, Ma n'ututu iti-nkpu-ọṅù gādi. Ma mu onwem, asirim n'udom, Agaghi-ewezugam n'ọnọdum rue mb͕e egighi-ebi. Jehova, I ji ka ihem si atọ Gi utọ me ka ike guzoro ukwu m: I zobere iru-Gi; aghọrọm onye nāma jijiji. Gi, Jehova, ka m'nākpọku; Ọ bu kwa Onye-nwe-ayi ka m'nāriọ aririọ-amara: Ùrù gini di n'ọbaram, mb͕e m'na-arida n'olùlù? Ájá, ọ̀ gēkele Gi? ò gēgosi ezi-okwu-Gi? Nuru, Jehova, me-kwa-ram amara: Jehova, buru onye nēyerem aka. I b͕anweworom iti-aka-n'obim ka ọ ghọ ite-egwú; I tọpuwo ákwà-nkpem, were ọṅù kem dika ihe-ọkiké: Ka nsọpurum we bùkue Gi abù ọma, ghara idere du. Jehova, bú Chinekem rue mb͕e ebighi-ebi ka m'gēkele Gi.