ABÙ ỌMA 27:7-10
ABÙ ỌMA 27:7-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Gee ntị mgbe m na-akpọku gị ONYENWE ANYị. Meere m ebere, zaa m. Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!” Ihu gị, ONYENWE ANYị, ka m ga-achọ. Ezonarịla m ihu gị, agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe; nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m. O Chineke, Onye nzọpụta m, ahapụkwala m. Ọ bụrụrị na nne na nna m ahapụ m, ONYENWE ANYị ga-anabata m.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 27ABÙ ỌMA 27:7-10 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, nuru mb͕e m'were olum kpọ òkù: Me-kwa-ram amara, zakwam. Gi ka obim siworo, Gi kwuru okwu, si, Chọnu irum; Iru-Gi, Jehova, ka m ga-achọ. Ezonarilam iru-Gi; Ejila iwe wezuga orù-Gi: Iye-akam ka I buworo; Ab͕anarilam, arapu-kwa-lam, Chineke nke nzọputam. N'ihi na nnam na nnem arapuwom, Ma Jehova gēkubatam.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 27