ABÙ ỌMA 27:4-6
ABÙ ỌMA 27:4-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka ONYENWE ANYị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ ONYENWE ANYị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma ONYENWE ANYị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya. Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu, ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya; ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya; ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume. Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu karịa ndị iro m gbara m gburugburu; aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya; aga m abụ abụ, kụọ egwu nye ONYENWE ANYị.
ABÙ ỌMA 27:4-6 Bible Nso (IGBOB)
Otù ihe ka m'riọworo n'aka Jehova, nke ahu ka m'nāchọ; Ọ bu ka m'biri n'ulo Jehova ubọchi nile nke ndum, Ihu idi-utọ Jehova, na ijuta ihe n'ulo uku Ya. N'ihi na Ọ gēdebem na nzuzo n'ulo-ntu-Ya n'ubọchi ihe ọjọ: Ọ gēzobem n'ebe-nzuzo nke ulo-ikwū-Ya; N'oké nkume ka Ọ gēbulim elu. Ma ub͕u a agēbuli isim elu n'elu ndi-irom dim buruburu; M'ga-achukwa àjà nke iti-nkpu n'ulo-ikwū-Ya; M'gābù abù, m'gābùku kwa Jehova abù ọma.