ABÙ ỌMA 27:1-6
ABÙ ỌMA 27:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? ONYENWE ANYị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu? Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha ka ha ripịa anụ ahụ m, ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị, bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa. Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu, obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla; ọ bụladị na agha adaa imegide m, nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi. Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka ONYENWE ANYị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ ONYENWE ANYị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma ONYENWE ANYị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya. Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu, ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya; ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya; ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume. Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu karịa ndị iro m gbara m gburugburu; aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya; aga m abụ abụ, kụọ egwu nye ONYENWE ANYị.
ABÙ ỌMA 27:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Jehova bu ìhèm na nzọputam; ònye ka m'gātu egwu? Jehova bu ebe siri ike nke ndum; ònye ka m'gātu oké egwu? Mb͕e ndi nēme ihe ọjọ biarurum nso iri anu-arum, Bú ndi nākpab͕um na ndi-irom, ha onwe-ha suru ngọngọ, da n'ala. Ọ buru na ọmuma-ulo-ikwū ndi-agha ama ulo-ikwū-ha imegidem, Obim agaghi-atu egwu: Ọ buru na agha ebilie imegidem, Na nka ka mu onwem nātukwasi obi. Otù ihe ka m'riọworo n'aka Jehova, nke ahu ka m'nāchọ; Ọ bu ka m'biri n'ulo Jehova ubọchi nile nke ndum, Ihu idi-utọ Jehova, na ijuta ihe n'ulo uku Ya. N'ihi na Ọ gēdebem na nzuzo n'ulo-ntu-Ya n'ubọchi ihe ọjọ: Ọ gēzobem n'ebe-nzuzo nke ulo-ikwū-Ya; N'oké nkume ka Ọ gēbulim elu. Ma ub͕u a agēbuli isim elu n'elu ndi-irom dim buruburu; M'ga-achukwa àjà nke iti-nkpu n'ulo-ikwū-Ya; M'gābù abù, m'gābùku kwa Jehova abù ọma.