ABÙ ỌMA 24:1-10
ABÙ ỌMA 24:1-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke ONYENWE ANYị; ụwa na ndị niile bi nʼime ya. Ọ tọrọ ntọala ya nʼime oke osimiri niile, o mekwara ka o guzosie ike. Onye bụ onye ahụ nwere ike irigo nʼelu ugwu ONYENWE ANYị? Onye nwere ike ịbata guzo nʼime ụlọnsọ ya? Ọ bụ onye aka ya emeghị ihe ọjọọ, obi ya dịkwa ọcha, onye na-adịghị atụkwasị obi na chi arụsị, maọbụ ṅụọ iyi aghụghọ. Ha ga-anata ngọzị site nʼaka ONYENWE ANYị, natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha. Otu a ka ọ ga-adịrị ọgbọ ndị ya, bụ ndị na-achọ ihu gị, Chineke nke Jekọb. Sela Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, meenụ ka isi unu bụrụ ihe e welitere, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka eze ebube nwee ike ịbata. Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ ONYENWE ANYị, onye bụ dimkpa na dike. Ọ bụ ONYENWE ANYị, onye bụ dike nʼagha. Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, buliekwanụ ha elu, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka Eze ebube nwee ike ịbatakwa. Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụ ya bụ Eze ebube! Sela
ABÙ ỌMA 24:1-10 Bible Nso (IGBOB)
Jehova nwe uwa na ùjú-ya; Elu-uwa dum madu bi na ndi bi nime ya. N'ihi na Ya onwe-ya atọwo ntọ-ala-ya n'elu oké osimiri nile, Me kwa ka o guzosie ike n'elu osimiri nile. Ònye gārigo n'ugwu Jehova? Ònye gēguzosi kwa ike n'ebe nsọ Ya? Onye nwere ọbu-aka abua nēmeghi ihe ọjọ, na obi di ọcha; Onye nēbulighi nkpuru-obi-ya nye ihe-efu, Ọ ṅughi kwa iyi aghughọ. Ọ gānata ngọzi n'aka Jehova, Na ezi omume naka Chineke nke nzọputa-ya. Nka bu ọb͕ọ nke ndi nācho Ya, Bú ndi nāchọsi iru-Gi ike, Chineke nke Jekob. Selah Ọnu-uzọ-ama, bulienu isi-unu elu; Ka ebuli kwa unu elu, ọnu-uzọ ebighi-ebi: Eze ebube gābata kwa. Ònye kwa bu Eze ebube a? Ọ bu Jehova, Nke bu dìnkpà na dike, Ọ bu Jehova, Nke bu dike n'agha. Ọnu-uzọ-ama, bulienu isi-unu elu; Buli-kwa-nu ha elu, ọnu-uzọ ebighi-ebi: Eze ebube gābata kwa. Ònye ka Ọ bu, bú Eze ebube a? Ọ bu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Ya onwe-ya bu Eze ebube a. Selah